Zaynab Alkali

O sị Wikiquote

Zaynab Alkali


Amụrụ Zaynab Alkali n'ime ezinụlọ Tura-Mazila na afọ ndị 1950. Ọ bụ onye Naijiria na-ede akwụkwọ akụkọ, onye edemede obere akụkọ,na onye edemede. Ọ bụ nwanyị mbụ na-ede akwụkwọ akụkọ si Ugwu Naịjirịa.

Okwu ndị ọkwụrụ[dezie]

  • Ọ dị mma nrọ aro ka anyị dị ndụ, anyị ga na-arọ nrọ. Mana ọ dịkwa mkpa icheta na dịka ụmụ ọhụrụ a turu ime ha mana ọ bụghị nrọ niile ka a mụrụ na-ndụ. Ụfọdụ na-ete ime. Ndị ọzọ da nwụ na-afo.
  • Mmụta meghere ụzọ wee nye onye ọ bụla nhọrọ na ndụ.
    • Zaynab Alkali n'akwụkwọ ya "The Descendants" ibe 13-14.[1]
  • Ọ na-ewute m na ọtụtụ ụmụ nwanyị, ọkachasị n'akụkụ obodo m, a na-azụ site na nwata ka ha were onwe ha dị ka ndị na-adịghị ike na ọgụgụ isi na enweghị ike iru ọkwa kachasị elu na mmepe ọgụgụ isi.
    • Na mkparịtaụka ya na Edozie Udeze nke mba ahụ gbara.[2]
  • Mgbe m gụrụ akwụkwọ, m na-elepụ anya maka ozi onye ode akwụkwọ na-agbalị izigara onye na-agụ ya. Ọrụ ahụ ọ nwere amamihe? Ọ dịla ihe m mụtara na ya? M na-achọkwa ihe ntụrụndụ. Enweela m ntụrụndụ nke ọma?
    • Na-ekwu okwu na N'ajụjụ ọnụ The Nation. [3]
  • Ọ bụrụ na ịchọrọ ịbụ ezigbo onye edemede, dee ihe ị chere na ị kwesịrị ide, ọ bụghị ihe ị chere ga-amasị gị ndị ga gụ edemede ahụ.
    • Zaynab Alkali na ajụjụ ọnụ ya na Kabafest Office.[4]
  • Olileanya na n’ebe ụfọdụ, n’ụzọ ụfọdụ, mmadụ pụrụ irite ihe n’echiche m, ọ na-eme m ịchee na etinyewo m ntakịrị ihe nye ndi mmadu. Na mgbakwunye na nke ahụ, nnabata mba na nke mba ụwa dị ukwuu
    • Zaynab Alkali na mkparịtaụka ya na Daily Trust gbara. ụgwọ
  • M ga-asị na ndụ chọrọ ka anyị ghara ịda mbà, n’agbanyeghị otú o siri sie ike. Ebiela m koodu dị mfe nke dị n'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe niile, kwere na Chineke ma na-arụ ọrụ ọma. (Cheta na Chineke anaghị ahapụ onye ọ bụla).
    • Zaynab Alkali na mkparịtaụka ya na Daily Trust gbara. ụgwọ
  • Ị dị ike ọrụ na-aga n'ọbara m. Ọ dịghị egbu egbu, ma umengwụ na-egbu. Ọ bụrụ na m ga-ede banyere onwe m, m ga-enwe ọtụtụ aha edemede narị otu narị, ikekwe aha maka ibe ọ bụla.
    • Zaynab Alkali na mkparịtaụka ya na Daily Trust gbara. ụgwọ

Njikọ mpụga[dezie]