Jump to content

Wiyaala

O sị Wikiquote
Wiyaala
mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịGhana Dezie
aha n'asụsụ obodoNoella Wiyaala Nwadei Dezie
aha enyereNoella Dezie
aha ezinụlọ yaNwadei Dezie
aha pseudonymLioness of Africa Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya22 Disemba 1986 Dezie
Ebe ọmụmụWa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Sissala, Wala Dezie
ebe agụmakwụkwọKanton Senior High School, Takoradi Technical University Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2011 Dezie
ngwa egwuolu egwụ, Jita Dezie
ụdịdance music, Jennifer Hudson, African popular music Dezie
webụsaịtịhttp://wiyaala.com/ Dezie

Wiyaala Noella Wiyaala Nwadei (a makwaara dị ka Wiyaala; amuru ya na 22 Disemba 1986) ọ bu onye Ghana na-abụ abụ Bekee kpọrọ Afro- pop mana na-ede kwa abụ.

Okwu ndị okwụrụ

[dezie]
  • Mgbe m na-etolite, Ụmụ nwanyị nweghị ọnụ okwu. Naanị ihe eji ha eme bụ ikebe ha di,maka na ọnụ ahịa isi nwanyị dị elu.Ahụrụ m ọtụtụ ụmụ nwanyị ka a kpọpụtara na klaasị ma nyefee ha na- aka ụmụ nwoke - na-abụkarị ndị okenye.
  • Anaghị m aga Ụka n’ihi na Ụlọ Ụka ndị dị n’akụkụ ebe m bi ugbu a na-eme oké mkpọtụ nke na-adịghị akpọ m òkù ka mụ na ha fee ofufe. Ekwenyere m na anyị na-aga ụka ife Chineke, na-abụ abụ ma na-ekpe ekpere mana ihe na-eme n'ógbè m enweghị atụ.
    • Abụ m onye okpukpere chi mana ịlụ Ụkọchukwu agaghị adị m mma. M na-agụ egwú ụwa, onye ụkọ chukwu agaghị ekwe ka nwunye ya na-eme otú ahụ. Ọ ga-akara m mma ịlụ onye na-eche echiche nweere onwe ya ka anyị wee nwee ike biri, ọkachasị onye na-abụghị oje ụka maọbụ ụkọchukwu
    • Christiana, Wiyaala kwuru na ya agaghị alụ ụkọchukwu , Pulse.com.gh', 30 Eprel 2015.
  • Enwere m ike ịgu ụdị egwu ọ bụla ma ọ bụ ụdị egwu m chọrọ...Reggae, Ragga, Ballad, African, Afro pop, ọbụna Pure pop. Dị ka onye Africa, e nwere m ihe Afrịka n'ime, nke m na achọghị ịla n'iyi maọbụ tufue n'ihi na m kwenyere site na ụbọchị mbụ na nke a ga-eme ka m pụta ìhè na ngwa ngwa,enweghị m ike ịhapụ nke ahụ.
  • Ọ bụ eziokwu na egwu m anaghị abụkarị kpọmkwem na ụdị egwu, mana m na-ahụ ya mgbe niile dị ka Afro-centric. M ga-ewepụta ọba egwu nke m ma emechaa n'afọ a (2016) na m ga-abụ abụ n'asụsụ obodo m nke Sissala na Wale yana Bekee. Ụfọdụ n'ime egwu ndị a ga-ada ụda ọdịnala na mpaghara ebe m tolitere, ebe ndị ọzọ ga-enwe mmetụta karịa.
  • N'ime ndụ m niile, a rọrọ m nrọ na otu ụbọchị m ga-arịgoro ọkwa mba ụwa wee gosipụta nkà na aka a aka m n'aha mba Ghana n'ụwa. M na-agwa ndị Afrịka niile, n'akụkụ ọ bụla ị nwere nkà, nwee nrọ, bido na-ebi ndụ nrọ ahụ. Anyị nwere ike ma gbanwee echiche gbasara Afrịka.


  • A gam ewu ewu dị ka ihe ọ bụla na Ugwu mana n'ihi na mmemme ([[Ghana Music Awards]) bụ na Accra, ọtụtụ ụlọ ọrụ redio dịkwa na Accra, ọ bụ ya mere ha ji anakari naanị [[[w:Accra|Accra]] egwu. Ọtụtụ n'ime DJ anaghị aghọta egwu anyị na ọtụtụ ndị anaghị adị njikere ịghọta egwu anyị.


    • Nne na nna ọ bụla ga-akụziri nwa ha olumba obodo ha, ọ bụrụ na i meghị nke ahụ, ọ bụ ihe ihere na mgbe ị na-ala n'ụlọ ha ga-akwa gị emo... ọ bụ otu ihe ị ga-amụta 'mmanye site n'ike'.
    • Asụsụ Omenala bụ njirimara m – Wiyaala, Ghana Web, 22 Nọvemba 2019.


  • Ekpebiri m ime ka ndị mmadụ mara onye Wiyaala bụ. Rock My Body mere n'ihi na m chọrọ ime ma isonye n'ihe na-ewu ewu. Nke ahụ bụ n'ihi na m kwere ka ụfọdụ ndị enyi m sị 'Oh mee nke a n'ihi na ọ na-ewu ewu. Ọ ga-eme ka ị bụrụ onye ama ama. [Ya mere, ekwuru m] ka anyị nweta ya [mere]'. N'ime ala, ejighị m n'aka.
  • 'Rock My Body', bụ egwu mmekọahụ mana ọ bụrụ na ọ pụta, ndị mmadụ ga-etinye m n'ụdị otu ụfọdụ m na -anọghị. Adị m na nta na imoloko . Enwere m ike ịbụ ụdị ọ bụla mana ọ dị m mkpa ịmalite nke ọma. Ọ bụrụ na etinyeghị m ntọala nke ọma na m na-abịa na mmalite na-ezighi ezi, otu ahụ ka ụlọ ọrụ ga-esi nata ya. Nkume ahụ m mere nke ahụ.

Njiko Mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: