Jump to content

Sara Gadalla Gubara

O sị Wikiquote

Sara Gadallah Gubara Al-Faki Ibrahim (Arabic: سارة جاد الله جبارة, romanized: Sāra Jādallah Jubāra; amụrụ 23 Eprel 1956) bu onye na-egwu mmiri n'asọmmpi nakwa onye isi nhazi ịmepụta ihe nkiri nke mba Sudan. Ọ bụ nwanyị Sudan mbụ sonyere n'asọmpi igwu mmiri nke mba ụwa, dịka asọmpi igwu mmiri dị ogologo nke Capri International na Italy, na nwanyị Sudan mbụ gwuuru mmiri n'ọ̀wà mmiri Bekee gaa France, n'agbanyeghị na ọ butere ọrịa polio n'oge ọ bụ nwata.

Okwu Ndị O Kwuru

[dezie]
  • Ike gwụrụ m nke ukwuu, achọkwaararị m ịkwụsị ma ọ bụrụ na ọ bụghị maka agbamume. Ha na-abụ abụ "Viva Sarah". Mgbe m ruru n'ọgwụgwụ, e buliri ọkọlọtọ Sudan ma kpọọ ukwe mba n'agbanyeghị na m bịara n'ọkwa nke abụọ, akwakwara m ákwá.
    • N'ajụjụ ọnụ agbara ya maka mmeri o meriri n'asọmmpi [1]
  • M na-echeta na mgbe m dị obere, m na-agwa ndị mụrụ m na ụmụaka na-akwa m emo. Ma mgbe m malitere igwu mmiri, ọ malitere ịdị m ka m na-eme ihe pụrụ iche, ọ dịghịkwa onye dị ka m.

Njikọ Mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: