Jump to content

Queen Nwokoye

O sị Wikiquote

Queen Nwokeye bụ onye Naijiria n'eme ihe nkiri (amụrụ n'abalị iri na otu nke ọnwa ọgọstụ n'afọ 1982). Ọ bụ onye Ihembosi dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo nke Steeti Anambra. Amara ya nke ọma site na agwa ọ gosipụtara na ihe nkiri akpọrọ Chetanna 2014.

==Kwotu==[dezie]

.Ezi ntukwasi obi enweghi ohere anya ụfụ,mgbe inwere ihe ịga nke ọma, enweghị ohere ịkpọasị.


.Ndị nwere obi wara wara bụ ha n'enwekacha ọnụ

. Mgbe ị na-ekwu okwu,ị na-ekwugharị ihe ị maarala,ma mgbe ị na-ege ege,ka ị̀ na amụta ihe ọhụrụ.


. Nwanyị jikwara onwe ya dịka mmiri iyi na-asọ asọ. Ọ n'aga ebe ọ bụla ọ chọrọ n'enweghi ituegwu,ma rukwa ebe njedebe ya, dịkwa njikere ịbụ onwe ya ma nọgidesie ike ịbụkwa onwe ya.


.Ihe ị cheere onwe gi bụ ihe kachasị mkpa karịa ihe ndị mmadụ che maka gị.

Nrụtụaka[dezie]

.[[About.Queen Nwokoye'']]

  • ^