Patti Boulaye
Ọdịdị
Patti Boulaye
Patricia Ngozi Komlosy' (amuru 3 May 1954) nke amara dika Patti Boulaye, bu onye British-Nigeria na-abụ abụ, onye na-eme ihe nkiri na onye na-ese ihe nke tolitere n'ọkwá mgbe o meriri Ihu Ọhụrụ na 1978 ma so na ndị isi ihe nkiri ndị isi ojii Britain na 1970s na 1980s. Na ala nna ya Nigeria, a na-echeta ya nke ọma maka ịgba egwu na mgbasa ozi Lux na Bisi, Daughter of the River, yana usoro nke ya, The Patti Boulaye Show.
Okwu Okwuru
[dezie]- Chineke meghere ụzọ ohere; Naanị ihe m ga-eme bụ; rụsie ọrụ ike, nọgide na-enwe nkwanye ùgwù onwe onye, ùgwù ma kwere na ihe ọ bụla merenụ, Chineke na-achị!
- [1] Patti Kpeere Chineke maka ihe ịga nke ọma ya na 2017.
- Ndụmọdụ m na-enye ndị na-agụ egwú bụ; bụrụ onwe gị, mana mara na ị nọ ebe ahụ ijere ndị ọzọ ozi na imetụ ndị ọzọ onyinye ahụ dị ebube, ya bụ olu gị.
- [2] Patti na-adụ ọdụ ndị na-abụ abụ na 2017.
- Iji nwee ihe ịga nke ọma n'ihe niile m na-atụkwasị uche, ịbụ nne na nna, ọrụ, ndụmọdụ wdg. Obi na-adị m ụtọ mgbe m na-emetụta ndụ ndị mmadụ nke ọma.
- [3] Patti kwuru maka ebumnuche ya na 2017.
- Ịbụ nne bụ ihe okike, kwụ ọtọ, mara mma ma ọ bụ ihe kacha sie ike n'ụwa.
- [4] Patti kwuru gbasara ịbụ nne na 2017.
- Obi ụtọ bụ ikwere na ịmara na Chineke na-achị. Ọ bụ inwe ahụ iru ala na onwe m, ịmara onwe m na ime ka Chineke bụrụ akụkụ dị mkpa nke ndụ m. Obi ụtọ bụ ịmara na Chineke hụrụ m n'anya, ọ dịghịkwa ihe m ga-atụ egwu.
- [5] Patti kọwara ihe obi ụtọ pụtara nye ya na 2017.
- Okwukwe nke nwatakịrị bịara dị ka ụzọ e si edekọ ndụ m, maka ụmụ m.
- [6] Patti kwuru na akụkọ ndụ ya na 2017.
- M na-eme nke a kemgbe afọ 2002. Ọ bụ ụzọ isi na-akụziri ụmụ m na mgbe Chineke ga-agọzi unu, unu aghaghị ịchọta ụzọ isi gọzie ndị mmadụ.
- [7] Patti kwuru maka ọrụ ebere ya na 2016.
- Nye m, ezinụlọ bụ gluu na-ejikọta m ọnụ. Ezinụlọ m na-akọwa m, site na nna nna m, ezigbo nne na-echebe m, ruo na di m hụrụ n'anya na ọmarịcha ụmụ.
- [8] Patti kwuru gbasara ezinaụlọ ya na 2016 .
- Abụ m onye Naijiria, anaghịkwa m ahụ onwe m dị ka onye Britain; ya mere, ahụghị m ka ọ na-abịa.
- [9] Patti kwuru maka onyinye ya dị ka OBE na 2016.
- Maka m, ụkpụrụ bụ akara nke ndụ; otú i si egosi onwe gị, na-ekwu okwu, na-eje ije; ihe ndị ị na-eme, ime mmụọ na ngagharị omume nakwa.
- [10] Patti kwuru okwu n'omume na 2016.
- Anaghị m eso ejiji, ejiji na-eso m. Ozugbo m yi uwe, achọghị m ịma ihe onye ọ bụla na-eyi.
- [11] Patti na ejiji na 2016.
Okwu gbasara Patti Boulaye
[dezie]- Mgbe m zutere gị Patti, echere m na ị bụ nwanyị a nke ji ngaji ọlaọcha mụrụ; Akpọkuru m ka mgbaghara. Ị nwere ndụ siri ike ma ndị niile chere na ha nwere nsogbu kwesịrị ịgụ akwụkwọ a.
- [12] Deede George Bush jnr na Akwụkwọ Patti na 2016.