Mulikat Akande-Adeola
Ọdịdị
Mulikat Akande-Adeola '(amuru n'abalị iri na otu nke ọnwa Novemba afọ 1960) bu onye okaiwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nnọchiteanya ụlọ ọrụ omebe iwu Naijiria n'Ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Peoples Democratic Party na-anọchite anya Ogbomoso North, South na mpaghara Orire n'afọ 2007 wee họpụta ya ọzọ n'afọ 2011.
Okwu ndị okwuru
[dezie]- Ihe kacha mma bụ ịkwụsị ọnwụnwa gị ngwa ngwa, ma gaa n’ihu.
- Naanị ihe mmadụ ga-ewere dị ka ihe mwute bụ na mmadụ enweghị ike ịhụ ihe ga-eme n’ọdịnihu.
- Ọ bụ òtù kwekọritara ọnụ kpatara ka e jiri bulie ya elu; òtù ọzọ nwekwara ike iwepu ya.
- Ihe kacha adịgide adịgide n'ụwa a bụ mgbanwe.
- A na m agwa ndị mmadụ na ọ bụrụ na ha chọrọ ịbanye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma nwee ihe nzuzo n'ulo ha, ha atara onwe ha ahụhụ.
- N’agbanyeghị na ndị mmadụ nwere ike inwe ọchịchọ, anyị kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ihi na imezu ọchịchọ ọ bụla sitere n’aka Chineke.
- Ọkwa ọ bụla ị chọrọ ga-enweta naanị n'ịdị n'otu n'ihi na anyị enweghị ọkwá onye nọọrọ onwe ya n'okpuru otu anyị.
- Ọ dị ezigbo mkpa. Ndị mmadụ kwesịrị ime ihe ziri ezi n'ihi na anyị nwere akwụkwọ iwu.
Njikọ mpụga ==
