Matilda Lambert

O sị Wikiquote
Matilda Lambert
Mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụMatilda Gogo Lambert Dezie
Aha enyereMatilda Dezie
aha ezinụlọ yaLambert Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-emeputa ihe nkiiri, omee Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Abuja, Mahadum nke Nigeria Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts, nzere masters Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaCatholicism Dezie
ihe nkiriUnroyal Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Matilda Gogo Lambert bu onye omee Naijiria, onye na-eme ihe nkiri, ihe nlere, na onye isi oche nke Tilda Goes Green Foundation. O mere ihe nkiri izizi ya na ihe nkiri The Celebrities na njikọ aka Mike Ezuruonye. Ọrụ ya na ihe nkiri ahụ mere ka ọ bụrụ onye ama ama wee nweta ọrụ ndu ya na ihe nkiri Nollywood ndị ọzọ.

Okwu ndị okwuru[dezie]

  • M na-achọkarị ịbụ onye nnọchianya otu na onye ọkwọ ụgbọ elu. Mgbe m mechara malite ife efe, ọgụghọzim ịbụ onye na-anya ụgbọ elu.
  • Ime ihe na-etinye gị n'ọkwa dị ka nke a, a ga-enwe ọtụtụ ihe ndọpụ uche. Otu ihe m na-agwa onwe m mgbe niile bụ na m batara na ụlọ ọrụ a maka ihe kpatara ya na enwere m ebumnuche. Abụ m nwa agbọghọ nwere mmasị. Abụ m onye mgbaru ọsọ. Anaghị m ege ndị na-aghọtaghị ihe m na-eme ma ọ bụ ebe m si abịa. Amụtala m ịbụ onwe m, ilekwasị anya na ịghara ige ntị na nkatọ na-adịghị mma na nke na-enweghị isi.
  • Ahụrụ m nwoke na-atụ egwu Chineke n'anya n'agbanyeghị ihe ọ na-eme. Ahụrụ m nwoke na-akwụwa aka ọtọ na onye mara mma na onye na-esi ísì ụtọ n'anya. Nke kachasị mkpa, ahụrụ m nwoke nke hụrụ nwanyị ya n'anya n'ezie ma kwado ọrụ ya n'anya. Ọ na-atọ ụtọ nke ukwuu mgbe ị nwere onye hụrụ gị n'anya ma na-akwado ihe ị na-eme, nwoke na-apụta maka gị ma mee ka ọ dị gị ka ọ bụ naanị nwa agbọghọ nọ n'ụwa.
  • Otu ihe ndị mmadụ na-amaghị banyere m bụ na m bụ onye nwere nchekwa onwe. A bụ m onye ihere nke ukwuu. Anaghịm enwe ahụ iru ala na mmadụ n'ụzọ dị mfe. Abụ m onye ihere nke ukwuu.
  • A bịa n'ihe gbasara ejiji, m na-eyi ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu, maka m, ọ gbasara inwe ahụ iru ala. O kwesịghị ịbụ ihe na-ewu ewu. Ọtụtụ mgbe, m na-eyi ihe ọ na-adị m mma, ọ bụchaghị banyere omume ahụ. Nke ahụ bụ ụdị m na nke ahụ bụ otú m si amasị ejiji.
  • Ntolitem bụ ihe obi ụtọ n'ihi na anam enweta ihe niile m chọrọ mgbe m bụ nwata. Amụghị́m n'elu ọgaranya mana n'ezinaụlọ anyị adaghị ụbịam. Abụ m obere nwa nnem n'ejin'aka, ebe papa m nwụnahụrụ m mgbe m dị obere. Nne m mere okpukpu abụọ nke ihe nne na nna nwere ike ime iji zụlite "Nwa ha hụrụ n'anya". A kụziirim na ọ dịghị ihe ọ bụla na-agaghị ekwe omume inweta na ndụ ma ọ bụrụ na m kwere na onwe m, ma tụkwasị Chineke obi, na-enwe mmasị maka ihe m na-eme na ịghara ịda mbà n'obi.
  • Ndụ kụziiri m na ihe ịga nke ọma abụghị ihe mberede, ịrụsi ọrụ ike ya, ntachi obi ya, ịchụ àjà na ihe kacha mkpa bụ ịhụnanya maka ihe ị na-eme ma ọ bụ ịmụta ime. Nke abụọ, ndụ akụzierela m ịhụ onwe m n’anya ma jiri m kpọrọ ihe n’ihi ụdị onye m bụ. Amụtakwara m ka m zere ndị na-adịghị mma/ndị na-egbu egbu. Ndụ kụziiri m ịnakwere mgbanwe na inwe ekele maka ihe niile na-eme na ịtụkwasị obi mgbe niile n'okwu Chineke. Ịtụkwasị Chineke obi apụtaghị na ọ ga-eme ihe niile ị chọrọ kama ikwere na ọ ga-eme ihe niile ọ maara na ọ dị mma.

Njikọ mpụga[dezie]

Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: