Madam Kofo
Ọdịdị
Madam Kofo
Kofoworola Abiola Atanda ' bu onye ome Ihe nkiri oma na Naijiria nke amara dị ka moniker Madam Kofo maka oru ya na soap opera bụ, Second chance.
Okwu okwuru
[dezie]- Anyị abụghị ndị ogbenye. Lelee m nke ọma na ị ga-ahụ ihe akaebe nke ibi ndụ dị mma.
- Abụ m onye na-eme ihe nkiri, m ga-abụkwa onye na-eme ihe nkiri n'ihi na ọ bụ mmasị m. Ọ bụrụ na ị nye m ọrụ m ga-egosipụta, m ga-agụ edemede m wee mee ya nke ọma dị ka onye na-eme ihe nkiri nwere nkà .
- Ọ na-atọ m ụtọ na m na-eme ka ndị mmadụ nwee obi ụtọ, na-etinye ọnụ ọchị na ihu ndị mmadụ ma na-emeju ndị ọbịa na ndị mbiara abia.
- Ekwetaghị m na ndị mmadụ na-ele m anya n'ụzọ na-atọ ọchị. Echere m na ihe masịrị ha. Ndị mmadụ nwere ike ịmata m ngwa ngwa na ụdị m, ọ bụ ụdị m na ahụrụ m ya n'anya. Ọ bụghị ụmụ nwanyị niile nwere ike kee ichafụ isi ha n'onwe ha. Ụfọdụ anaghịdị ekekọta ya ma ọlị, mana enwere m ike ijikọ onwe ma kekwa ndị mmadụ. M nnọọ e kpebirim na a ga-eji ihe pụrụ iche mara m, ụdị a na-adịghị ahụkebe na otú ahụ ka m si malite n'ụdị ejiji m n'eji.