Lydia Canaan
Ọdịdị
Canaanbụ onye na-agụ egwu ma bụrụkwa onye Lebanọn, onye na-akwado ọdịmma mmadụ, na onye nnọchi anya mba ụwa. Achọpụtara ya maka oke ụda olu ya nwere octave anọ, edemede abụ, na ụdị olu pụrụ iche, a na-ekwupụtakwa ya dị ka onye mbụ na-edekọ ihe na Lebanon iji nweta ọganiihu zuru ụwa ọnụ. A na-ewere ya dị ka kpakpando nkume mbụ nke Middle East, a na-edepụta ya na Rock and Roll Hall of Fame and Museum's Library and Archives.
Okwu okwuru
[dezie]- A mụrụ m n’ụwa nwere oke ókè, ihe mgbochi, na ahịrị ndị a na-ekechi anya. Ebe ọ bụkwa na enweghị m ike ịgbanwe ụwa gbara m gburugburu, E kere m ụwa n’ime m, ejidesikwara m ya ike. Ọ bụ ụwa na-enweghị oke, ihe mgbochi, ma ọ bụ ahịrị ịkpa ókè. Ọ bụ ụwa olileanya.
- Enwere m okwukwe. Ekwere m na obodo a. Ekwere m na mmụọ nke ndị a. abum ada ala nka. Abụ m onye Kenan.
- Nsogbu dị anyị n'ihu bụ nsogbu nke amaghịihe na enweghị mmekọ. Nkà bụ ụzọ a na-apụghị ịpụ apụ dị irè iji luso ya ọgụ. Oge eruwo mgbe anyi ka ewepụ uche na "art of diplomacy" ma tinye anya na "artistic diplomacy.
- Anyị nwere aura gbasara anyị nke na-esiwanye ike mgbe ị nwere okwukwe na onwe gị. Ma mgbe aura gị siri ike, ihe ọjọọ agaghị emetụ gị aka
- Dị ka e hotara na N'ajụjụ ọnụ Sudha Chandran, Gulf Today/Panorama, Nọvemba 24, 2000
- Ebumnuche mu bu inye ndi mmadụ ihe ha ga-elejere anya
- Evolushọn mmadụ kwesịrị ịbụ evolushọn nke mmadụ
- Art bụ asụsụ zuru ụwa ọnụ, nnukwu akwa mmiri gafere okpukperechi. Ọ bụghị ndị na-akwado ya, ndị na-efe ofufe, ndị kwere ekwe, ma ọ bụ ndị a tọghatara n'ụdị ọ bụla, kama ọ bụ ndị òtù okpukpe ahụ bụ ịhụnanya.
Njikọ mpụga
[dezie]
[[Category: Ndị dị ndụ]