Leymah Gbowee

O sị Wikiquote

Roberta Gbowee (amuru 1 Febụwarị 1972) bụ onye na-akwado udo Liberia nwere ọrụ maka idu otu ndị inyom na-adịghị eme ihe ike, Women of Liberia Mass Action for Peace nke nyere aka weta njedebe Agha obodo Laịberịa nke abụọ na 2003.

Leymah Gbowee no Fronteiras do Pensamento Porto Alegre 2013 (9730904969)

Ihe ndị ọ kwụrụ[dezie]

  • Ọchịchị bụ ịguzoro ndị gị. Ndị mmadụ na-ekwu na ị ga-adị ndụ ịlụ ọgụ ụbọchị ọzọ, mana mgbe ụfọdụ ị ga-egosi na ị bụ ezigbo onye ndu.
  • A na m eme njem ugbu a iji mezuo ọchịchọ, n'obere ikike m, nke ụmụ agbọghọ Africa.
  • Onwere ihe n'uwa a nke onye obula nwere ike ime. Chineke kere anyị niile ma nye anyi ihe pụrụ iche iji nye onyinye.
  • Otu ihe m na-atụtụbeghị ụjọ bụ iguzo n’ihu ndị dị ukwu ikwuputa uche m. M na-anọchite anya ụmụ nwanyị ndị nwere ike ha gaghị enwe ohere ịga UN ma ọ bụ izute onyeisi oche. Anaghị m atụ egwu ikwu eziokwu nye ọchịchị.
  • Ana m agwa ndị mmadụ, iwe dị mmiri mmiri. Ọ na soputa a soputa, ọ dị ka mmiri. Ị tinye ya n'ime akpa ọ ga ewere ọdịdị nke akpa ahụ. Ọtụtụ ndị ị na-ahụ n’ụlọ mkpọrọ na-ebuso ndị ha agha, iwe na-ewe ha, ha were iwe were tinye ya n’ime akpa ihe ike.
  • Ọ bụrụ na ị na-ekpe ikpe ziri ezi nye otu onye, ​​ndị ahụ emetụtara kwesịkwara ikpe ikpe ziri ezi.
  • Mgbe m dị afọ iri ba asaa, oge mbụ m hụrụ ozu nwụrụ anwụ, ahụ jụrụ m oyi. Ka ọ na-erule afọ iri atọ na otu ọ bụụrụ m ihe ndapụta, ọ nweghịkwa otu mmadụ kwesịrị ibi ụdị ndụ ahụ.
  • M bụ ezigbo nchekwube. M si na obodo ebe ị nwere ntakịrị ihe ị ga-atụ anya ya, yabụ ị ga-abụ onye nwere nchekwube mgbe niile.
  • Abịawo m n'otu nkwubi okwu: Ihe niile m bụ, ihe niile na-achọsi ike ịbụ, ihe niile m bụbu, bụ site n'amara nke Chineke. Enwere ọtụtụ ụmụ nwanyị na Africa, na n'èzí Africa, ndị nwere ọgụgụ isi karịa m.

Ebensidee[dezie]