Kirsty Coventry

O sị Wikiquote
Kirsty Coventry (2018)

Kirsty Leigh Coventry

Kirsty Leigh Coventry Seward (amụrụ 16 Septemba 1983) bụ onye minista na-ahụ maka ntorobịa, egwuregwu, nka na ihe ntụrụndụ ugbu a n'ime Cabinet nke Zimbabwe. O rigooro n'ọkwa a n'ọnwa Septemba 2018. Ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zimbabwe, onye bụbu onye na-egwu mmiri n'egwuregwu Olympic, onye ji nturuugo mba ụwa na onye egwuregwu Olympic a kacha chọọ ya mma n'Africa. Ọ bụ onye otu  International Olympic Committee (IOC) na n'isi mmalite 2018, a họpụtara ya dika onye isi oche nke Commission Athletes' nke IOC, otu na-anọchite anya ndị niile na-eme egwuregwu Olympic n'ụwa niile.

Ihe ndị Okwuru[dezie]

  • Ndị mmadụ ga-anọgide ma kwenye na nrọ ndị ahụ ha rọrọ. Ọ dị ezigbo mkpa.
  • Ana m eji ohere ọ bụla m nwere ike bulie ọkọlọtọ obodo anyị elu n'ezie wee nweta ìhè dị mma n'ihe dị n'ebe ahụ.
  • Onye ọ bụla nọ n'ebe ahụ nke gụnyere onye-isi ala Mugabe maara na ihe kwesịrị ịgbanwe n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ọnọdụ na-adịghi mma.
  • Onye ọ bụla nọ n'ụlọ na-akwado ya. Ndị mmadụ na-ama m, kwuo ụdị mpako ha ji m eme. Ọ dị egwu ịnụ, ọ dị ịtụnanya ịmara na enwere m ike imetụ ọtụtụ mmadụ aka n'ụzọ dị mma.
  • Ewezugawom onwe m n'okwu gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ekwetaghị m na ọ ga-adị mma ikwu banyere ya.
  • Ọ na-esikari ike idowe ọnọdụ gị n'elu karịa ịrigo n'ọnọdụ di elu.

Ebensidee[dezie]

Njikọ Mpuga[dezie]