John Jea

O sị Wikiquote

John Jea, Onye Nkwusa Africa. Jea bụ ohu site na nwata, mgbe ọ nwetasịrị nnwere onwe ya na 1790s gara njem ma kwusaa ozi ọma n'ọtụtụ ebe.

OKWU NDI OKWURU[dezie]

  • A na-eduhiekarị anyị n’echiche bụ́ na ndị nna anyị ukwu bụ chi anyị; ma n’oge ndị ọzọ anyị na-etinye echiche anyị na anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, na-ele ha anya, dị ka a ga-asị na ha nwere ike ịzọpụta anyị; n'ikpeazụ, anyị chọpụtara, n'oke ndakpọ olileanya anyị, na ihe ndị a abụghị ihe ọzọ ma ọ bụghị ọrụ nke Onye Kasị Elu; nke a mere ka m na-eche ka onye-nwe m siri kwupụta ugboro ugboro na ụlọ ya nile, ala, anụ ụlọ, ndị odibo, na ihe ọbụla o nwere bụ nke ya; n’echeghị na ọ bụ Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha, onye kwuworo na ọla-edo na ọla-ọcha, ala, na njupụta ya, bụ nke ya.
  • Ọnụma m na obi ọjọọ m megide onye ọ bụla na-efe ofufe dị nnọọ ukwuu nke na m gaara ebibi ha nile, ma ọ bụrụ n’ike m; iwem we di uku nke-uku na m'batara n'ebe-nchu-àjà, nke mere na, "udi irum we b͕anwe," dika Nebukadneza, mb͕e o nyere iwu ka ewe tubà Shedrak na Mishak na Abednego n'oké ọku ahu. Iwe m dị ọkụ karị megide onye ozi ahụ, na m gaara egbu ya, ma ọ bụrụ na m atụghị ndị mmadụ egwu, ọ bụghị n'ike m igbu ya, wutere m nke ukwuu; m wee gaa n’ụlọ kọọrọ onye-nwe m ihe onye ozi ahụ kwuru, na ihe ụgha ọ kọrọ, dị ka m chere, n’olileanya na ọ gaghị ezite m ọzọ; ma ebe ọ matara na nke a bụ ahụhụ nye m, o mere ka m gaa karịa, n’ihi na o doro anya na ọ bụghị maka ọdịmma nke mkpụrụ-obi m; nke a wutere m nke ukwuu, nke mere m ji tuo onye ozi ahụ ụta ahụ, n’eche na o mezuru

EDENSIBIA[dezie]