Gaa na ọdịnaya

Francisca Nneka Okeke

Sitere na Wikiquote

Francisca Nneka Okeke Francisca Nneka Okeke bụ ọkàmmụta fiziks. Ọ bu onye aka Naijiria. Ọ bụ ọkammụta nke Fiziks na Mahadum Nigeria, Nsukka ma bụrụ kwa nwanyị mbụ rụrụ ọrụ dịka onye isi nwanyị nke ngalaba na Mahadum.

Okwu okwuru

[dezie]
  • Mgbe m dị obere, mbara igwe masịrị m. M nọ na-eche ihe mere o ji na-acha ọcha mgbe ụfọdụ, mgbe ụfọdụkwa na-acha anụnụ anụnụ, ihe mere ụgbọ elu ji efe kama ịda n’ala. Ọ bụ mgbe ahụ ka m chọpụtara n'ụlọ akwụkwọ na fiziks nwere ike inye m azịza ajụjụ ndị a. N'oge ahụ, amaara m ihe m chọrọ ime.
  • 'Anyị kwesịrị ịgba ndị inyom ume ugboro ugboro. Ọ bụ ya mere m ji dee okwu na-agba ụmụ nwanyị ume, na-agba ụmụ agbọghọ ume isonye. N'ihi na ọ bụrụ na ha anaghị eso na mmepe sayensị na teknụzụ, ọ pụtara na ha anaghị etinye aka na mmepe obodo.'
  • Mgbe m malitere, ọ dị naanị ụmụ nwanyị abụọ na ngalaba Fiziks. Mana mgbe m bụ onyeisi, enyere m aka n'ịhọpụta ụmụ nwanyị atọ ọzọ. Mgbe m bụ onyeisi, ihe kacha m mkpa bụ ịnye ụmụ nwanyị ruru eru na ngalaba ahụ, gụnyere Mgbakọ na Mwepụ, Fiziks, Geology, Kemistri, Ọnụọgụgụ na Sayensị Kọmputa. Ugbu a, anyị bụ ọtụtụ ụmụ nwanyị na ngalaba Fiziks.[1]

Ebensidee

[dezie]

Njikọ Mpuga

[dezie]