Gaa na ọdịnaya

Folashade Abugan

Sitere na Wikiquote

Folashade Abigeal Abugan (amụrụ n'abalị iri na asaa n'ọnwa Disemba, afọ 1990) bụ onye na-agba ọsọ na Naijirịa nke nwere ipuiche na 400 metres. Ọ bụkwa onye nrita 400m Bronze medal nke emere na 2007 All Africa Games. O mechara gbaa mbọ nwee ike rita Silver medal na 2008 African Championships in Athletics, ebe ọ tụnyere oge ọsọ ọhụrụ na 50.89. O ritekwara Gold medal na 2008 World Junior Championships in Athletics ya na 2009 African Junior Athletics Championships. O sonyere n'asọmpi 2010 Commonwealth Games na mba Delhi ebe o ritara Naijirịa ihenrite ọlaọcha abụọ site ịgba ọsọ 400m na 4x400m relay.

Okwu okwuru

[dezie]
  • Adị m mma ugbu a ma na-eme nke ọma karị. Amalitela m ọzụzụ. Anọ m na South Africa, mana ugbu a, anọ m na Akure, Ondo State. Mana enwere m olile anya na m ga-abia Lagos n'izu na-abịa. N'ọnwa Ọktoba, a ga m alaghachi ịmalite nke ọhụrụ.
  • Obi dị m ụtọ imeri n’ihi na afọ anọ gara aga, enwetara m ihe nrite ọla ma na nke ugbu a, abụ m onye mmeri nke Africa. Oge a abụrụla m nnukwu oge ka m ghọrọ onye mmeri mba, merie ọla na IAAF World Relays na ọlaọcha na asọmpi Commonwealth. M ga-azụ ọzụzụ nke ọma n'ihu Continental Cup.

Njiko Mpuga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: