Elizabeth Holmes

O sị Wikiquote
Elizabeth Holmes n'afọ 2014

Elizabeth Anne Holmes (amụrụ Febụwarị 3,1984) bụ onye òmé mpụ nke mba America ekperela ikpe ma tụkwaa mkpọrọ, na onye bụbu onye ọchụ nta ego na ngalaba biotechnology. N'afọ 2003, Holmes tọrọ ntọala ma bụrụ onye isi ọrụ (CEO) nke Theranos, ụlọ ọrụ teknụzụ ahụike nke na-adịghịzi ugbua nke anụrụ aha ya nke ọma n'ịgbakọ ma kwuo ego ole ihe n'ada n'ahịa, mgbe ụlọ ọrụ ahụ kwuchara na ha agbanweela nnyocha ọbara site n'ịmepụta ụzọ ndị nwere ike iji obere ọbara ebe ọ dị ịtụnanya mee ihe, dị ka site na mkpịsị aka aka . Ka ọ na-erule 2015, Forbes' akpọwo Holmes onye nke kacha dị ntorobịa kacha baa ọgaranya o mere onwe ya na America na ndabere nke ọnụ ahịa nke ụlọ ọrụ ya nke dị ijeri dọla itoolu. N'afọ sochirinụ, ka mkpughe nke nnwere-ike igwu wayo banyere nkwupụta Theranos malitere ịpụta, Forbes degharịrị atụmatụ nke ọnụọgụgụ ego o nwere bịa na efu, na Fortune deputara aha ya n'ime akụkọ njirimara ya maka "Ndị ndu iri na itoolu kachasị ekwesighi ntụkwasị obi nke ụwa".

Okwu Ndị O Kwuru[dezie]

  • A ga-akụtu gị ugboro ugboro, ị na-ebilikwa.
  • Nke a bụ ihe na-eme mgbe ị na-arụ ọrụ ka I gbanwee ihe, E buru ụzọ chee na ị na-agba ara, ha alụso gị ọgụ, ma n'otu ntabianya, ị gbanwee ụwa.
  • Ama m na anyị mehiere emeghe
  • Ihe magburu onwe ya banyere otú e si zụọ m bụ na ọ dịghị onye gwara m na m gaghị emeli ihe ndị ahụ.
  • Emere m ihe, anyị emewokwa ihe, nke gbanwere ndụ ndị mmadụ. Ọ ga-akara m mma ibi ndụ nwere nzube karịa nke m nwere ike inwe ihe ndị ọzọ ma ọ bụghị nke ahụ.


  • Oge ahụ bụ mgbe ị ga-ahụ ihe a mụrụ gị ime. Nye mụ onwe m, erutere m ebe m na-etinye oge m niile na-ime nke a, ma na na-emefusị ego ndị mụrụ m na nkuzi m na-adịghị aga. Ya mere enwere m oge ahụ ebe anya doro m: Nke a bụ ihe m chọrọ iji ndụ m mee.
  • Mgbe ndị mmadụ na-asị, 'Achọrọ m ịmalite azụmahịa,' ajụjụ m na-abụkarị, 'Gịnị kpatara ya?' N'ihi na a ga-enweriri ozi - a ga-enweriri ihe mere i ga-eji n'eme ya n'agbanyeghị otú ọ siri sie ike, ị chọrọ ịnọgide na-eme ya ugboro ugboro, n'ihi na ị hụrụ ime ya n'anya.
  • Mgbe Ị chọtara ihe ịhụrụ ime ya n'anya, Ị mee ya. Ọ bụ ya.
  • " M ga-ekwu ihe atọ: Chọta ihe ị hụrụ n'anya, ekwekwala ka ọ laa n'agbanyeghị ihe ọ bụla. M ga-asị na Winston Churchill maara n'ezie ihe ọ na-ekwu mgbe ọ sịrị, 'Adakwala mba! Adakwala mba! Ya adịla mgbe ọ bụla Ị ga-eme ya! Chaa! Chaa! Chaa!' M ga-ekwukwa na abụ m onye akaebe dị ndụ na-egosi na ọ bụ eziokwu na ọ bụrụ na ị nwere ike iche ihe n'echiche, ị nwere ike nweta ya.

Nkokọ Mpụga[dezie]

Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: