Clara Lemlich

O sị Wikiquote
Clara Lemlich 1910

Clara Lemlich bu onye amuru na March 28, 1886 – Julaị 12, 1982) bụ onye ndu nke ọgba aghara nke mmadụ 20,000, nnukwu ntigbu nke ndị ọrụ akwa uwe na New York na afo 1909, ebe o kwuru okwu na Yiddish wee kpọọ oku ka emee ya. Mgbe e mesịrị, e debanyere aha ya n' ajo akwukwo maka otu ndị ọrụ ya, ọ ghọrọ onye otu Communist Party USA na onye na-akwado ndị oru. N'ime afọ ikpeazụ ya dị ka onye bi n'ebe a na-elekọta ndị agadi, o nyere aka ịhazi ndị ọrụ

ihe okwuru[dezie]

  • Egere m ndị na-ekwu okwu niile ntị, enweghịkwa m ndidi ọzọ maka ikwu okwu. Abụ m nwa agbọghọ na-arụ ọrụ, otu n'ime ndị na-emegide ọnọdụ ndị a na-apụghị ịnagide. Ike gwụrụ m ige ndị ọkà okwu na-ekwu okwu n'ozuzu. Ihe anyị nọ ebe a bụ ikpebi ma a ga-agba agbugba oru ma ọ bụ na anyi agaghi agba. M na-eme mkpesa na anyị ga-agba agbugba oru."
  • "Gịnị ka m maara banyere otu ndị ọrụ? Obi ike — nke ahụ bụ naanị ihe m nwere. Obi ike!”
  • "Abụ m nwa agbọghọ na-arụ ọrụ," ka Lemlich kpọsara. "Otu n'ime ndị na agba agbugba ọrụ megide ọnọdụ ndị na-adịghị anabata, ike gwụrụ m ige ndị ọkà okwu na-ekwu okwu n'ozuzu okwu. Ihe anyị nọ ebe a bụ ikpebi ma anyị a ga-agba agbugba oru ma ọ bụ na anyị agaghị agba.

Njiko Mpuga[dezie]