Bukky Wright
Ọdịdị
Bukky Wright' (a mụrụ 31 Maachị 1967) bụ onye ome ejije na nwanyị ọchụnta ego Naijiria. Ọ ya nwe ụlọ ejiji B Collections na spa B Wright.
Bukky bidoro ọrụ ime ihe nkiri n'afọ 1996. Ọ pụtara n'ọtụtụ ihe nkiri Nollywood nke Yoruba na asụsụ bekee, gụnyere ihe onyonyo nke Wale Adenuga's Television series Super story.
N'afọ 2014, Bukky Wright zọrọ ọkwa Honourable n'ụlọ omeiwu Ogun steeti n'okpuru ikpo okwu Social Democratic Party (SDP) nke onye bụbu Gọvanọ Olusegun Osoba na-edu.
Okwu Ndi Okwuru
[dezie]- "Ọ bụrụ na e nwere ịhụnanya na nghọta, mbara igwe ga-abụ mmalite mmadụ. Ihe mbụ ị ga-achọ ịrịọ Chineke bụ ka o nye gị onye mmekọ nghọta."
- "N'ọrụ ọ bụla ị so, ọ naghị a ụ mgbe niile akwa ndina, ị ga-akwụ ụgwọ gị ma gbalịsie ike ịbịarute ọkwa ebe ị nwere ike ikwu ọnụ ahịa gị."
- “Ọtụtụ ndị na-emere m ebere ma chefuo m'anyị na-eme naanị ejije.
- "Na-ebi ndụ gị n'agbanyeghị ihe ọ bụla. Na-ebi ndụ gị maka onwe gị na ụmụ gị. N'ihi na n'agbanyeghị ihe ị na-agbalị ime, n'agbanyeghị otú ị na-agbalị imeju ha afọ, ha ka na-achọ mgbe nile iji gị tụnyere onye na-abụghị gị."
- “Bụrụ asọmpi nke onwe gị na ihe na-aga gburugburu, na-abịakwa gburugburu, O kwuru, sị, Ọ bụrụ na ịchọrọ imeri n'ọsọ, echela maka ihe mmegide ahụ n'ihi na ozugbo ịmalitere echiche maka ihe mmegide, ị gaghị emeri n'ọsọ."
- "Ọ dị mfe mgbe niile ịkatọ ndị nọ n'ọchịchị mgbe anyị bụ ndị na-ekiri ekiri. Ruo mgbe anyị rutere ebe ahụ, ị ghọta oge ahụ na mgbanwe bụ ihe siri ike".
- "Ndụ jupụtara n'ọgba aghara na ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na ị bụ ụdị onye na-adịghị akwa ákwá maka mmiri ara ehi wụfuru, ị ga-aga n'ihu n'agbanyeghị ihe mgbochi".
Njikọ mpụga
[dezie]Bukky Wright na Wikiquote Bekee
