Buchi Emecheta

O sị Wikiquote

Buchi Emecheta

Florence Onyebuchi "Buchi" Emecheta OBE (Julai 21, 1944 – 25 Jenụwarị 2017) bụ onye odee akwụkwọ amụrụ na Naijiria. O dere akwụkwọ karịrị iri abụọ n'ọnụ ọgụ, nke gụnyere Second Class Citizen (1974), The Bride Price (1976), The Slave Girl (1977) and The Joys of Motherhood (1979). Ọtụtụ n'ime akwụkwọ ndị o dere na mbido bụ Allison na Busby bipụtara ya, ebe onye nnyocha akwụkwọ ya bụ Margaret Busby.

Okwu ndị O Kwuru[dezie]

  • Ekwenyere m na ọ dị mkpa ịgwa ndị na-agụ akwụkwọ gị okwu n'onwe gị ... iji mee ka ndị mmadụ ghọta m n'ozuzu òkè. Ekwesịrị m ide ma kwuo okwu. Ana m ahụta ọrụ m dịka onye ode akwụkwọ nakwa dịka onye na-ekwurịta okwu ọnụ.
  • M na-arụ ọrụ maka nnwere onwe nke ụmụ nwanyị mana abụghị m onye nkwuchite-ọnụ ụmụ nwanyị. Abụ m naanị nwanyị.
    • [1] N'okwu ya n'ụlọ mgbasa ozi BBC; 2017 Jan. 26)
  • Ụmụ nwanyị ojii nọ n'ụwa niile kwesịrị ịdị n'otu ma nyochaa ọzọ ka akụkọ ihe mere eme si kwuo maka anyị.
    • [2] N'akụkọ ụwa ụlọ mgbasa ozi BBC; 2017 Jan 26)
  • Ma ònye nyere iwu ka anyị ghara inwe olileanya n’ebe ụmụ anyị ndị inyom nọ? Anyị, ụmụ nwanyị, na-edebanye aha n'iwu ahụ karịa onye ọ bụla. Ruo mgbe anyị gbanwere ihe a niile, ọ ka bụ ụwa nwoke, nke ụmụ nwanyị ga-enyere aka mgbe niile.
    • [3] N'okwu ya n'òkìkè nwanyị
  • Ihe dị ole na ole dị njọ dịka akọnuche obi amamikpe.
    • [4] N'okwu ya maka omume
  • N'ịbụ onye odeakwụkwọ nwanyị, m ga-aghọgbu onwe m ma ọ bụrụ na m kwuo na m na-ede ihe kpamkpam site n'iche echiche ka nwoke. Ọ nweghị ihe ọjọọ dị na ya, mana nke ahụ anaghị eme ka m bụrụ onye na-ekwuchite-ọnụ ụmụ nwanyị site n'edemede. Akpọrọ m aha ahụ asị. Mkpado ahụ sitere na ụwa ọdịda anyanwụ - dịka a na-akpọ anyị Ụwa nke atọ.
    • "Zikoko" "Abụghị m onye nkwuchite-ọnụ ụmụ nwanyị"

Njikọ mpụga[dezie]

Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: