Broda Shaggi

O sị Wikiquote

Broda Shaggi

Samuel Animashaun Perry, onye amara aha ya dị ka Broda Shaggi, bụ onye Naijiria na-eme ihe na-atọ ọchị, onye na-eme ihe nkiri, onye na-ede abụ na onye na-agụ egwu. Ọ bụ onye Ishagamu dị na Ogun steeti mana a mụrụ ya na Ikene na steeti Ogun. Mgbe ọ ka dị obere, o nwere mmasị n'ime ihe nkiri dị ka nna ya nwụrụ anwụ bụ́ onye nkụzi ihe nkiri si metụta ya.

Ihe Ndị O kwuru[dezie]

  • Ọ dị mkpa ime ka ndị na-ege gị ntị kwere ihe ha na-ahụ. Ndị mmadụ ga na-enwe echiche dị iche n'ihe mgbe niile.
  • Achọrọ m ka e cheta m maka ihe dị mma. Ọ na-eme ka m mụrụ anya, na-eche echiche n'abalị na ịmepụta ọdịnaya ndị ọzọ.
  • N'agbanyeghị na m na-arụ ọrụ nke agboro, ọ dịghị onye chọrọ ịghọ agboro.
  • Anaghị m elekwasịkarị okpukpe anya mgbe niile n’ihi na e nwere okpukpe tupu ndị ọcha abịa Africa.
  • Ebumnobi m bụ imetuta ndị mmadụ n'ihe ọchị n'ụzọ dị mma.[1]


Ebenside[dezie]