Gaa na ọdịnaya

Adunni Ade

Sitere na Wikiquote
Adunni Ade in 2020

Adunni Ade (amụrụ n'abalị asaa n'ọnwa Jun, afọ 1986) bụ onye omere Amerịka/Naịjirịa  na ihe nlere anya. A mụrụ ya na Queens, New York, United States nye nne German-Irish na nna Yoruba Naịjirịa. Ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị n'ụlọ akwụkwọ Chrisland Primary School nke dị na Opebi na Steetị Lagos ebe o nwetara asambodo First School Leaving Certificate, ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọ akwụkwọ Bells Comprehensive Secondary School nke dị na Ota na Steetị Ogun. Adunni Ade gụrụ akwụkwọ mahadum n'ụlọ akwụkwọ University Of Kentucky nke dị na Amerịka ebe ọ gụrụ Accounting.

Okwu Ndị Okwụrụ

[dezie]
  • Onyinye kachasị ukwuu ị nwere ike inye ụmụ gị bụ mgbọrọgwụ nke ọrụ na nku nke nnwere onwe. Ka ụmụ anyị tolite ike na Ngọzi.
  • Kwụsị mmegbu nke ndị gị niile n'aha ike. Me ihe ziri ezi, chebe ndị gị.
  • A ka nwere ịhụnanya n'ebe ahụ n'agbanyeghị na ndị mmadụ na-agbalị ịgọnarị na-ekwu na ọ dịghị ọzọ ịhụnanya, a ka nwere ịhụnanya.

Njikọ mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà:

Adunni Ade na Wikiquote Bekee