Adrianne Wadewitz
Ọdịdị
Adrianne Wadewitz
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha n'asụsụ obodo | Adrianne Wadewitz |
aha enyere | Adrianne |
aha ezinụlọ ya | Wadewitz |
ụbọchị ọmụmụ ya | 6 Jenụwarị 1977 |
Ebe ọmụmụ | Omaha |
Ụbọchị ọnwụ ya | 8 Eprel 2014 |
Ebe ọ nwụrụ | Palm Springs |
Ụdị ọnwụ | accidental death |
ihe kpatara ọnwụ | falling from height |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | professor, intellectual, Wikipedian |
ụdị ọrụ ya | English literature, children's literature, digital humanities, Wikipedia, 18th century literature |
onye were ọrụ | Occidental College, Indiana University |
Ọkwá o ji | women's rights activist |
ebe agụmakwụkwọ | Columbia University, North Platte High School, Indiana University |
Ebe ọrụ | Njikota Obodo Amerika |
Andrianne Wadewitz (Jenụwarị 6, 1977 - Eprel 8, 2014) bụ ọkà mmụta nwanyị nke mba Amerika nke na-ekwu okwu maka ikike nwanyị dere ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ nke mba Britain na senchuri nke iri na asatọ, onye ode akwukwọ Wikipidia ama ama, na onye na-ekwu okwu banyere (karịsịa) okwu gbasara nwoke na nwanyị na Wikipidia.
Okwu Ndị O kwuru
[dezie]Ọ bụrụ na mpempe ozi adịghị mma maọbụ na-akọwahie ya na Wikipedia, ọ na-emetụta otú ụwa dum si ele isiokwu ahụ anya.
- Mehrotra, Karishma. (March 26, 2014). "Mahadum gasị 'edegharịa' Wikipidia ikpoju ólùlù gasị, tinye ụmụ nwanyị". USA Today.
- N'ezie, anyị chọrọ ịbawanye ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị. Mana naanị ịbawanye ọnụ ọgụ ụmụ nwanyị abụghị ihe ga-eme ka ọ dịkwuo mma - bụ eziokwu dị na ọdịnaya nke Wikipedia n'onwe ya na-agbagọ.
- Wholf, Tracy (May 18, 2014). "Ntinye uche 'ode akwukwọ Wikipidia' na ihe gbasara ohere di na isiokwu nke ịbụ nwoke maọbu nwanyị nke weebụsaịtị ahụ". PBS NewsHour (PBS). Retrieved May 19, 2014.
- Ya mere, m na-eche na otu ihe Wikipedia ga-eme dịka otu omenala bụ ịjụ onwe ya, 'Ànyị dị njikere - ịdị ụdị a - ụdị nhọrọ onwe a - na - bụrụ nke dị ụdị ntakịrị a?' Anyị nwere ike inwe ọtụtụ ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị dị njikere ịbụ obodo aka ya gbasapụrụ ịnabata ndị ọzọ.
- Wholf, Tracy (May 18, 2014). "Ntinye uche ode akwụkwọ Wikipidia' na ihe gbasara ohere di na isiokwu nke ịbụ nwoke maọbu nwanyị nke weebụsaịtị ahụ". PBS NewsHour (PBS). Retrieved May 19, 2014.
- Ya mere, n'otu akụkụ, m ga-ekwu na anyị kwesịrị ịgbakwunye olu nke ndị na-ekwu maka ikike nwanyị na Wikipedia ndị na-aga ikwu okwu banyere-ụmụ nwanyị dị ka ndị anọchitere anya ha n'ụzọ dị nta.
- Wholf, Tracy (May 18, 2014). "Ntinye uche 'ode akwụkwọ Wikipidia' na ihe gbasara ohere di na isiokwu nke ịbụ nwoke maọbu nwanyị nke weebụsaịtị ahụ". PBS NewsHour (PBS). Retrieved May 19, 2014.
- Ọ nwere ihe m maara banyere otú e si mepụta akwụkwọ nkà ihe ọmụma mbụ na senchuri iri na asatọ. Na akwụkwọ nkà ihe ọmụma ndị ahụ fọrọ ntakịrị ka ewepụ kpam kpam akụkọ mbido nke ụmụ nwanyị. Ma ọ bụ otu arụmụka anyị na-eme mgbe niile.
- Wholf, Tracy (May 18, 2014). "Ntinye uche 'ode akwụkwọ Wikipidia' na ihe gbasara ohere di na isiokwu nke ịbụ nwoke maọbu nwanyị nke weebụsaịtị ahụ". PBS NewsHour (PBS). Retrieved May 19, 2014.
- Mgbe anyị na-agwa ndị Wikipedia na ndị na-abụghị ndị Wikipedia okwu, anyị na-ekwu, sị, 'Lee, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgụnye akụkọ ndị ọzọ niile a ma e wezụga akụkọ a na-ahụkarị nke anyị na-ekwukarị banyere ndị ọcha nwụrụ anwụ, anyị ga-etibanye ya ebe ahụ ugbua.'
- Wholf, Tracy (May 18, 2014). "Ntinye uche 'ode akwụkwọ Wikipidia' na ihe gbasara ohere di na isiokwu nke ịbụ nwoke maọbu nwanyị nke weebụsaịtị ahụ". PBS NewsHour (PBS). Retrieved May 19, 2014.
Njikọ Mpụga
[dezie]- Adrianne Wadewitz na Wikikwuotu bekee
- Adrianne Wadewitz na Wikipidia Igbo