Adesuwa Aighewi

O sị Wikiquote
Adesuwa Aighewi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
aha ezinụlọ yaAdesuwa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Eprel 1992 Dezie
Ebe ọmụmụMinneapolis Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụmodel, filmmaker Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Maryland, University of Maryland Eastern Shore Dezie
Ihe nriteOkayAfrica 100 Women Dezie

Adesuwa Thongpond Pariyasapat Aighewi bụ onye a na-elere elere na ngalaba ejiji nke mba Amerika nakwa onye na-eme ihe nkiri. N'afọ 2018, ahọpụtara ya dịka osote onye nke mbụ maka "Breakout Star of the Year Award" nke models.com. N'ebe Jenụwarị 2019, Aighewi so n'òtù ndị a na-elere elere iri ise nke mbụ “Top 50 Models” site na models.com.

Okwu Ndị O Kwuru[dezie]

Mgbe m gbachiri ntutu isi m n'igaru na izu ejiji New York (New York Fashion Week) enwere m nkwaghachi azụ ụfọdụ site n'aka ndị mmadụ n'ụlọ ọrụ ahụ na-echegbu onwe ha na mụ agaghị enweta ọrụ - aro ha tụrụ bụ na m nwere ike ịdị ka m na-eji "oke oji". Ma ọ na-atọ m ụtọ inwe oyiyi dị iche maọbu ịgbapụ iche - ya mere ekpebiri m idebe ha ma were ohere bịaara m.

  • M na-arụ ọrụ, m na-adị agwa onwe m, 'Abụ m ngwaahịa. Ọ bụghị gbasara gị. Ọ bụ gbasara ọhụụ ndị a nwere maka ngwaahịa ha, nke na ị nwere daba maọbụ ịgaghị adaba n'echiche ha.
  • Achọrọ m ime ihe ndebanye gasị ga-agbanwe òtù ndị mmadụ si ahụta ndị Afrịka.
  • Ọtụtụ ihe onyonyo m hụrụ maka ụmụ nwanyị na hijab adịghị mma. Achọrọ m igosi ụwa na Islam abụghị ihe egwu. Achọrọ m ka onye ọ bụla hụ ihe m na-ahụ.
  • Achọbuuru m ịrụ ọrụ nke ga-adịrị onye ọbụla mfe mgbárí. Echiche dị ya bụ ime ihe nkiri vidiyo nke gosipụtara ịma mma nke ụmụ nwanyị Alakụba. Naanị n'ihi na iyi akwa mkpuchi hijab apụtaghị na ị na-akpa egwu. Ọ bụghị gbasara agbụrụ. Ọ bụghị gbasara okpukperechi. Ọ bụghị gbasara uwe. Ọ bụ maka ịma mma.
  • Ọ bụ ihe siri ike nke ukwuu iwere ịbụ onye a na-elere elere dịka ọrụ na Nigeria n'ihi mmetụta nke nne na nna anyị ha. Ị gaghị enweta nkwado ndị mụrụ gị karịsịa mgbe ha chọrọ ka ị bụrụ ihe ọzọ dị ka ịbụ onye ọkaiwu maọbụ dọkịta.
  • Anọ m na-ejemozi iji mebie nkọwa na echiche America banyere Islam. Maka ndekọ, abụ m onye Buddha. Ebumnobi ya bụ ịkwalite ịdịn'otu.
  • Òkwè isi sekpụ ntị m na-akụ na njedebe m na ebe ọ na-aga dị anya pụọ na nkwago ime ihe nlereanya nke New York. Achọrọ m ịga n'ihu n'ọrụ m na sinima na nkà. Naijiria na-ama m n'anya n'ihi na ọ bụ naanị ebe m na enwe mmetụta onye nọ n'ụlọ ya. Mgbe m laghachiri Naijiria ịbịa hụ ụlọ dara ada, akụrụngwa na-adịghị mma na okporo ụzọ ọjọọ gasị, m na-amalite iche na anyị kwesịrị imekwu ihe iji dozie ihe karịa ichere gọọmenti. Oge eruola ime ka ihe gawara agbụrụ na obodo anyị sarị sarị. Ọ dịghị onye ga-emere agbụrụ ojii nke a.

Njikọ Mpụga[dezie]

Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: