Adenike Osofisan

O sị Wikiquote
Adenike Osofisan
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdenike Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya11 Maachị 1950 Dezie
Ebe ọmụmụOsogbo Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, university teacher Dezie
onye were ọrụMahadum nke Ibadan Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo, Georgia Tech, Mahadum nke Ibadan Dezie
onye ndụmọdụ doctoralAdebayo Dada Akinde Dezie
doctoral studentBamidele Ayodeji Oluwade, Babatunde Opeoluwa Akinkunmi Dezie
Academia.edu profile URLhttps://ibadan.academia.edu/AdenikeOsofisan Dezie

Adenike Osofisan (amụrụ 11 Maachị 1950) bụ ọkammụta sayensị Kọmputa nke ala Naijiria, onye bụ ọkachamara na ngwuputa data na njikwa ihe ọmụma. Ọ bụ ya bụ nwanyị Naijiria mbụ nwetara nzere Ph.D. na Kọmputa Sayensị, ógó O rururịị n'afọ 1989. N'afọ 2006, ọ ghọrọ onye ọkammụta zuru oke na mahadum nke Ibadan, mbuli elu mere ya ka ọ bụrụ nwanyị Afrịka mbụ ghọrọ ọkammụta sayensị Kọmputa.

Okwu Ndị O Kwuru[dezie]

  • Enwere ọtụtụ ihe na-eme ka ụlọ akwụkwọ Lord's Schools bụrụ ọpụrụiche. Ha na-enye ụmụ akwụkwọ ha ọzụzụ zuru oke ma na-akụziri ha ịtụ egwu Jehova. Ha na-azụ ụmụaka ka ha bụrụ ezigbo ụmụ amaala Naịjirịa. Ha nwekwara ebe a na-azụ ehi, ebe a na-azụ ọkụkọ, ubi, na ndị ọzọ.
    • [1] Ọkammụta Adenike n'okwu O kwuru maka ụlọ akwụkwọ Lord's Schools n'afọ 2019.
  • Gbasara Kudirat kwa, dike nwanyị nke ochichi onye kwuo uche ya, enwere m obi uto nke ukwuu na a na-asọpụrụ m tinyere ndi dike abuo ahu. Enwere m mpako maka ya.
    • [2] Ọkammụta Osofisan na mkparịtaụka O mere maka nkwanye ugwu akwanyeere ya n'afọ 2019.
  • Ọtụtụ ndị mmadụ na-aghọtahie ya. Akụrụngwa ndị e nwere taa karịrị ndị e nwere n’oge anyị. N'oge anyị, ihe ọmụmụ General Science ka ewepụtara naanị n'afọ ikpeazụ anyị. Otú ọ dị, taa, ọbụna site na ụlọ akwụkwọ praịmarị, a na-ekpughere ụmụaka ọmụmụ kọmputa, sayensị na ihe ndị yiri ya.
    • [3] Ọkammụta Adenike mgbe ọ n'atule ógó ọmụmụ akwụkwọ mgbe nke ha na ugbua n'afọ 2019.
  • Amaghị m. Ma kaosinadị, enwere m obi ụtọ. Ị maara ụdị mmetụta ahụ, mmetụta abụọ dị iche iche. Enwere m nnọọ obi ụtọ na ọñụ. N'otu oge ahụ, ọ dị m nnọọ ka ọ bụrụ na papa m ka dị ndụ ịgba àmà ya.
    • [4] Ọkammụta Adenike mgbe ọ na-ekwuputa ụdị mmetụta o nwere mgbe enyere ya nturu ugo idebanye aha ya na Nigerian Women Hall of Fame n'afọ 2019.
  • Akpọrọ m nwanyị ígwè maka na m bụ nwanyị ihe na-agara nke ọma
    • [5] Ọkammụta Osofisan n'akwụkwọ mgbasa ozi Punch News n'afọ 2019.
  • Enweghị ihe nkepụta ọhụrụ ọbụla na anaghị eweta mma na njọ. Otú ọ dị, ọ dabeere na akụkụ nke ị chọrọ iwere
    • [6] Ọkammụta Adenike on n'okwu ya maka ihe nlụpụta ọ̀gbọ́ nzikọrita ozi soshal midia n'izulite ụmụaka n'afọ 2019.
  • Ịzụ nwa akwụkwọ n'ógó mahadum bụ nnukwu ego. Anyị na-eji agụmakwụkwọ na-egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ukwuu, ma ọ bụrụhaala na ị na-eji agụmakwụkwọ egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe agaghị aga nke ọma. Nke ahụ bụ eziokwu.
    • [7] Ọkammụta Adenike na ndụmọdụ o nyèrè maka ịkwalite agụmakwụkwọ n'afọ 2019.

Njikọ Mpụga[dezie]

Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: