Adejoke Orelope-Adefulire
Ọdịdị
Victoria Adejoke Orelope-Adefulire
Victoria Adejoke Orelope-Adefulire (amụrụ 29 Septemba, 1959) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria. Ọ rụrụ ọrụ dịka osote gọvanọ Legọs steeti n'afọ 2011 ruo 2015. Tupu mgbe ahụ, ọ bụ kọmishọna na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na ibelata ịda ogbenye nke Lagos steeti site na 2003 ruo 2011.
Okwu Ndị Okwuru
[dezie]Ụmụ agbọghọ nwere ike ịgbanwe ụwa. Ka anyị kwado, kuziere ha, ma nye ha ike, n'ihi na ha bụ ndị ndu ga-eme n'ọdịnihu ga-eweta mgbanwe dị mma na Naijiria na ụwa.