2011 FIFA world cup

O sị Wikiquote

Iko mba ụwa nke ụmụ nwanyị 2011 bụ asọmmpi iko mba ụwa nke isii nke FIFA bụ ngalaba na-ahụ maka egwuregwu Ịgba bọọlụ nke mba ụwa niile hiwere, nke bụ nke nturu ugo n'ụwa nile gbaa gburugburu nye ndị òtù egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị na mba ụwa niile dị iche iche ndị ga-emeri. Emere ya site na abalị iri abụo na isii nke ọnwa Juun ruo abalị iri na asaa nke ọnwa Julaị afọ 2011 na mba Jamani, ndị nke nwetara ikike ihiwe mmemme ahụ n'ala ha n'ọnwa Ọktoba afọ 2007. Mba Japan meriri asọmmpi nke ikpeazụ ya n'egwuregwu ahụ megide mba Amerika n'ọgbụgba ntaramahụhụ mgbe agbachara ọkpụ abụọ okpụ abụọ (2-2) ka oge mgbatị ahụ gasịrị, wee bụrụ ndị Eshia mbụ meriri otu FIFA World Cup n'ihe a na-ewere dịka ogbugbu kacha ukwuu n'ụkwụ ụwa.