Gaa na ọdịnaya

Yara Shahidi

Sitere na Wikiquote
Yara Shahidi

Yara Shahidi (amụrụ mkpụrụ ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị 2000) bụ nwanyị Amerika na-eme ihe nkiri amara maka ọrụ ya na Black-ish, na osote ya bụ Grown-ish.

Okwu ndị o kwuru

[dezie]
  • Nyere m, olileanya bụ nkwenye n'onwe m
  • Ịme ntụgharị uche nke ukwuu gbasara ịdị ndụ nkịtị anaghị enye ụbụrụ gị ohere iche echiche, nke ọma, banyere gịnị mere anyị ji ebi ndụ?
  • Ọ na-eju anya iche echiche banyere ụdị mmebi ụfọdụ sistemụ ndị a si mebie, etu ụfọdụ ngwaọrụ anyị maka mgbanwe si ezughị oke.
  • N'ihe nkiri, ị bụ onye ọ̀zọ. Ihe niile gbasara gị agbanweela. N'ime ụlọ ntu ahụ, ihe mgbaru ọsọ bụ ịbụ onye gị.
  • Ịbụ onye isi ojii na onye Iran bụ ihe na-arụ ọrụ ọbụna n'amaghị ama n'ihe m na-eweta n'ọrụ.
  • “Ọ bụghị maka ọdịdị ma ọ bụ ịchọ ka ọ dị ka m a ma eme ihe niile.”
  • Agụmakwụkwọ bụ akụkụ dị mkpa ná ndụ m mgbe niile
  • Ndị mụrụ m tinyere echiche a na mmụta bụ njem ndụ niile, ma ọ bụ n'ime klaasị ma ọ bụ n'ụwa.
  • Ọ dị mma ịghara ịnwe azịza niile
  • Anyị enweghị ike ịdabere na ọnọdụ dị ugbu a, ma anyị ga achọkwa igbaso ụzọ ndị na-adịghị mma
  • Hapụ onwe gị ka ighara ịma ka esi eme ihe
  • Ọ bụghị mgbalị m niile ga-aga nke ọma.
  • Anyị anọghị ebe a ịma ihe, anyị nọ ebe a ịmụta ihe.
  • Mmụta kacha mma na-eme mgbe anyị nyere onwe anyị ikike ịmụta ihe ọhụrụ.
  • Ịchọta ihe na-emezu anyị bụ ihe ịga nke ọma kachasị úkwú.
  • Ọ dị mma inwe ọtụtụ agụụ na ịchụso ha n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche
  • Nye onwe gị nnwere onwe inyocha ngalaba dị iche iche
  • Afọ iri abụọ m abụrụla nnwale na-adịghị mma n'ịchọpụta etu m ga esi nye onwe m ohere ịnọ n'ọnọdụ dị mma.
  • Enwere m ụdị echiche na-ezighị ezi na m kwesịrị ịdị mma ozugbo, ọ bụghịkwa ụzọ isi chọpụta ụzọ ọhụrụ.
  • Otu n'ime ihe omume kachasị ukwuu n'ịchọ ịmata ihe bụ nzọụkwụ mbụ nke ọrụ onwe onye, nke ịgwa onwe m okwu gbasara ịbụ onye dị njọ na-ịme ihe, na ikwe ka m bụrụ onye na-amu ihe n'enweghị ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ onye na-aga n'ihu n'ihe.
  • Agụmakwụkwọ m mere ka m nwee ike ikwu okwu n'atụghị egwu gbasara ihe ndị m na-akwado n'ọrụ m
  • Echere m na m nọ ebe a naanị n'ihi ndị bịara tupu m abịa
  • Mmepụta ejiji siri ike, mana mgbe ndị mmadụ bịara na mma nke ha, ọ na-akpali akpali nke ukwuu.
  • Echiche mbụ na eziokwu yiri m n'ihi na, n'ọkwa ime mmụọ, nke mmetụta uche karịa, ọ bụ banyere ịnọgide na-enwe obi ike n'onye ị bụ.
  • Mana ihe na-amasị m nke ukwuu gbasara nkwekọ dị n'etiti oge na oghere nke mere ugbua bụ eziokwu ahụ bụ na ọ dịghị ihe m bụ ihu ya, maka na mgbe m lere ọtụtụ ndị ọgbọ m anya, e nwere ndị na-arụ otu ọrụ ahụ, ọtụtụ ọrụ, ọrụ dị iche karịa m.
  • Akọwa m ọdịnihu m dị ka nke dị n'akụkụ iwu.
  • Agaghị m ahụ onwe m n'ọnọdụ ebe m na-ata ụta maka ihe m na-eme.
  • Anyị chọrọ ka a gosipụta ụdị onwe anyị a n'ụzọ ime mmụọ, uche, na mmetụta uche ọ bụla nke anụ ahụ, nke karịrị ikwu na abụ m nwanyị agba aja aja, ma ọ bụ abụ m nwanyị ojii na TV, mana m na-ekwu, Abụ m naanị akụkụ nke obodo m
  • Anyị na-aga n'ihu na-emebi ọrụ nke otu esi eji, ọkachasị, ụlọ mgbasa ozi, megide ndị pere mpe n'ụdị ọ bụla
  • Ọtụtụ mgbe n'okwu, [a na-eji agba] dị ka ịgọnarị oji ozugbo
  • Aghọtara m na mgbe ụkpụrụ m na-adabaghị na nke ụwa gbara m gburugburu, oge eruola ka m gbanwee ụkpụrụ ụwa.
  • Akụkọ banyere mbata n'obodo ọzọ bụ ihe nwere njikọ na nke m n'enweghị mgbagha.
  • Ịhapụ ịdị afọ iri na ụma m na-atụ m ụjọ nke ukwuu.
  • Njem ịghọ onye na-eme ihe nkiri abụghị nke dabere na ọchịchọ a ịnọ na ihuenyo , kama ọ dabere na ọchịchọ a ịbụ akụkụ nke ịkọ akụkọ.
  • Echiche m nke obi ike sitere n'eziokwu ahụ bụ na enwere m mmetụta nke ịbụ onye a na ahụ anya nke ọma n'ụlọ m, site n'ihe m na-ele anya, site n'eziokwu ahụ bụ na ndị mụrụ m hiwere ihe anyị na-akpọ usoro ọmụmụ akwụkwọ ọzọ, akụkọ ifo, ebe mmadụ niile bụ ndị zuru ụwa ọnụ, ndị isi ojii, ndị aja aja, si n'akụkụ ụwa niile dị iche iche
  • Ajụjụ nke ihe mere ndị na-ege ntị ga eji kwesị ichebara echiche bụ ihe anyị nwere ịza mgbe niile.

Njikọ mpuga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: