Gaa na ọdịnaya

Victorine Q. Adams

Sitere na Wikiquote

Victorine Quille Adams' (née Quille; amụrụ n'abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Eprel, afọ 1912 - abalị asatọ n'ọnwa Jenụarị, afọ 2006) bụ nwanyị mbụ onye Afrịka-Amerịka jere ozi na Kansụl Obodo Baltimore. Amụrụ ya n'obodo Baltimore wee jee ụlọ akwụkwọ sekondrị na Fredrick Douglass High School, mechaa jee Coppin Teachers College (nke bụzi Coppin State University ugbua), o jekwara Morgan State College (nke bụzi Morgan State University ugbua). Mgbe ọ gụchara akwụkwọ kọlej, ọ rụrụ ọrụ onye nkuzi n'obodo Baltimore afọ iri na anọ. Victorine Quille Adams tụgharịrị anya ya tinye na ndọrọ-ndọrọ ọchịchị mgbe o mepụtara otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ụmụnwanyị nke akpọrọ Colored Democratic Women's Campaign Committee n'afọ 1946.

= Okwu okwu

[dezie]
  • Ekwesịrị ka a were m ọ bụghị naanị dị ka nwunye Willie Adams kama dị ka nwanyị ji mmetụta ya na akụ na ụba ya mee ka obodo o bi na ya dịkwuo mma.
  • Akwula m Baltimore ụgwọ m. Echere m na ekwesịrị ka a na-ewere m ọ bụghị naanị dị ka (a) nwunye kama dị ka nwanyị nke jiri mmetụta ya na akụ-na-ụba ya mee ka obodo o bi na ya dịkwuo mma.
[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: