Gaa na ọdịnaya

Tomilayo adekanye

Sitere na Wikiquote

Tomilayo Adekanye (amụrụ n'abalị abụọ n'ọnwa Septemba afọ 1942) bụ ọkammụta Naijiria n'ihe gbasara akụnaụba ọrụ ugbo. Ọ bụ onye Ọkammụta nwanyị mbụ na ngalaba ọbụla metụtara ọrụ ugbo na ala anyị Naijiria, na onye mbụ n'ihe gbasara akụnaụba ọrụ ugbo n'Afịrịka niile gbaa gburugburu. O bidoro ọrụ ikuzi na mahadum ya dịka n'ime ndị n'akuzi nkuzi na ngalaba Agricultural Economics na Mahadum Obafemi Awolowo University (nke bụụrụ Mahadum Ife mgbe ahụ) n'àgbàtà afọ 1966 na afọ 1975. O mechara gafee na ngalaba Agricultural Economics nke Mahadum Ibadan dịka onye nkuzi nta (Lecturer I n'afọ 1975), ebe o si gbagoo n'ógó onye nkuzi ukwu n'afọ 1977, Osote ọkammụta (ọgụ akwụkwọ) n'afọ 1980, wee toruzie dịka ọkammụta zuru ezu n'afọ 1983. N'àgbàtà afọ 1990 na 1991, ọ bụụrụ kọmishọna n'ahụ maka azụmahịa na ntinye ego na steeti oyo. O nwebukwa mgbe ọ bụụrụ kọmishọna n'ahụ maka ọrụ̀ ugbo naanị otu ugboro na steeti ahụ. Ọ n'alu Bayo Adekanye, ọkammụta na ngalaba sayensị ndọrọndọrọ ọchịchị (Political Science) nakwa onye isi na ndị na-achị Mahadum Chrisland . Ụlọ ọrụ dị iche iche ndị ọ bụbuuru onye ntuziaka nye n'ógó mba ụwa gụnyere ECA, ILO, FAO, IFAD, UNDP, UNICEF, UNIFEM na Ford Foundation

Ihe Ndi O Kwuru

[dezie]

Njikọ Mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: