Thulisile Nomkhosi "Thuli" Madonsela
A mụrụ ya na 28 Septemba 1962) bụ onye ndụmọdụ (advocate) na ọkà mmụta iwu si South Africa, nke jidere oche n’ihe gbasara ntụziaka mmekọrịta mmadụ na ibe ya (social justice) na Mahadum Stellenbosch kemgbe Jenụwarị 2018. Ọ rụrụ ọrụ dịka Onye Nlekọta Ọha (Public Protector) South Africa site na 19 Ọktoba 2009 ruo 14 Ọktoba 2016. N’afọ 1996, ọ nyere aka ide atụmatụ ikpeazụ nke Iwu Ọchịchị South Africa, nke onye isi ala Nelson Mandela wepụtara.
Ókwú ndị ọkwụrụ
[dezie]- Onye Nlekọta Ọha gara aga: Onye ndụmọdụ Thuli Madonsela" (Julaị 2018)
Onye Nlekọta Ọha gàrà aga: Ónyé ndụmọdụ Thuli Madonsela (Julaị, 2018) sité n'aka ịchọta weghachiri na 18 Julaị 2022
Ọ bụrụ na ịchọrọ ịga npgwa ngwa, gaa naanị gị. Ọ bụrụ na ịchọrọ ịga anya, gaa na ndị ọzọ.
E kwere m na ihe ọ bụla m na-eme ga-ada ụda na ihe m kwenyere bụ ebumnuche ndụ m.
Anyị na-eme ka ọchịchị ndị mmadụ rụọ ọrụ maka onye ọ bụla.
Enweghi nhata bụ mma agha nwere mma abụọ.
Mmezu bụ akụkụ nzuzo nke omume ọma.
Mee naanị ihe ziri ezi n’ihi na ọ bụ ihe kwesịrị ime.**
- Thuli Madonsela: "Nwanyị íké ígwè South Africa", Ajụjụ ọnụ Corruption Watch.
“Achọrọ m ịnụ nke ọma ka m wee nweé iké ige ihe a na-agụghị n’ọnụ.”
“Anyị amaghi ma ndị nzuzu nkịtị ma ọ bụ naanị ndị na-adịghị edozi anya n’ala nwere ike wéré obi gbasie ike ime m ihe ọjọọ.”
“Soro obi gị, ihe ọ bụla i na-eme. Ị na-etinye ọdịnihu gị na nke anyị n’aka ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ga-achị n’ogo mba na nke ógbè.”
“Siteé n’ụzọ ndụ, m mụtara na onye kacha mkpa n’ime ndị na-akpa ikpe, onye nkwubi ókwú ya gbásárá omume m ji nnukwu uru, bụ nkwụsi obi m.”**
- Daalụ Thuli – Ị nyere anyị olileanya na obi ike. [2]
“Olileanya bụ obere ọkụ na-enye gị okwukwe n’ihe omume ọdịnihu nke yiri ka agaghị ekwe omume.”
“Ụtụtụ a echetara m na ọ bụ Amara kpatara m jere ebe niile m gara, duru m gafee ihe isi ike, ma ọ bụkwa Amara kpatara m dị ebe a.” [1]
“Otu n’ime onyinye kacha ukwuu i nwere ike inye mmadụ chọrọ olileanya bụ ntakịrị ọchị.” [2]
“Na mmalite izu ọhụrụ, ọ bara uru ilekwasị anya n’ihu, na-eleghachi azụ obere oge n’ihe e mụtara na mmejọ ekwesịghị imeghari ọzọ.” [3]
“Ọ dị oke mkpa ka nwa agbọghọ ọ bụla kpebie, n’oge kacha nso o kwere mee, onye ọ bụ na ihe onyinyé ya ga-abụ nye mmadụ niile.”**
Njikọ Mpugo
[dezie][Category:Ndị nwanyi ọkà íwú]]
