Talithia Williams
Ọdịdị
Talithia D. Williams bụ Ọkammụta mba America. Ọ na-ejekwa ozi dị ka Prọfesọ mgbakọ na mwepụ na Onye isi ụlọ ọgwụ Mathematics na kọleji Harvey Mudd, onye na-eme nchọpụta gbasara usoro spatiotemporal nke data. Williams bụ nwanyị mbụ onye African American nwetara ọrụ na kọleji Harvey Mudd. Ọ bụ onye nkwado maka itinyekwu ndị Africa America na injinia na na ngalaba sayensị.
Okwu ndị okwuru
[dezie]- Tupu efu abụrụ akụkụ nke mgbakọ na mwepụ, anyị enweghịbu mkpa ịkọwapụta efu.
- Efu nyere aka na ngbanwe nke mgbakọ na mwepụ ka ọ bụrụ asụsụ nwere ike inye aka ịghota ajụjụ siri ike - dị ka, gịnị pekarịrị efu na mpe?
- Site n’inye onwe anyị ikike ịnọdụ ala na ịtụgharị uche n’ihe na efu na inye ya nhazi, inye ya uru—anyị na-enyekwa onwe anyị ikike dị ka ọha mmadụ iche echiche banyere ihe ndị siri ike na ihe ndị dị mgbagwoju anya.
- Pecenti iri asatọ na ise nke ndị dọkịta na-ekpe na mkpa ọha mmadụ ana-egboghị na-eduga na ahụike adịghị mma, mana naanị pecenti iri abụọ nwere obi ike na ha nwere ike gboo mkpa ndị ahụ.
- Ndị dọkịta enweghị ike igbo mkpa niile nke ndị ọrịa naanị ha.
- Ọ baghị uru na m na-agwa gị ka ị rie nri nke ọma n'ihi na nri adịghị n'ime radius 50-mile nke gị… [ndị na-ahụ maka nlekọta] enweghị ike inye aka na okwu ahụ. Ha na-ahụ nsogbu ahụ, ha ghọtara ya, ma gịnị ka dọkịta ahụ pụrụ ime iji dozie nsogbu ahụ n'ezie? A naghị enye ha ike ịza ya.
