Gaa na ọdịnaya

Susani Violet Mathye

Sitere na Wikiquote

Susani Violet Mathye bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị si South Africa nke nọchitere anya African National Congress (ANC) n’ime Limpopo Provincial Legislature kemgbe afọ 2014. A họpụtara ya mbụ n’ime omeiwu steeti na ntuli aka izugbe nke 2014, ebe o guzoro n’ọnụọgụ iri abụọ na isii (26) n’akwụkwọ ndepụta ndị otu ANC.

Okwu ndị okwuru

[dezie]
  • Dị ka e si kọọ, bọs ahụ gara n’elu ebe okirikiri ụzọ, nke bụ okirikiri okporo ụzọ ikpeazụ site na Makhado gaa Polokwane, n’ ọsọ ọsọ, wehapụkwa njikwa ma tụgharịa, nke butere ọnwụ na mmerụ ahụ nye ndị njem nọ n’ime ya.
  • A na-akọ na onye ọkwọ ụgbọ ala ahụ bụ onye ọhụrụ n’ọrụ ya ma amaghị ebe ahụ nke ọma. A sachachala ebe ihe merenụ, a kpọrọkwa ndị njem merụrụ ahụ gaa n’ụlọ ọgwụ dị iche iche n’Makhado.
    • Violet Mathye na-akọwa mberede bọs dị na Limpopo
  • Ányị ji obi ike jụọ ọnụ ihe omume a na-enweghị uche na nke na-adịghị mmadụ n’anya. N’otu aka ahụ, e nwere ntakịrị ntụsara ahụ n’ihi na e jidere ndị a na-enyo enyo atọ mgbe ihe ọjọọ a gasịrị, ha nọkwa ugbu a n’ụlọikpe. E ji m n’aka na ihe akaebe dị n’aka anyị zuru oke iji mee ka ndị omekome a nọrọ n’ime ụlọ mkpọrọ wee kpọrọ ihu ike iwu n’ụzọ zuru oke.
    • Violet Mathye jụrụ ọnụ ikpe mmadụ n’onwe ha (ịkpọ mmadụ ikpe n’aka ọha)


  • Oge ọ bụla ha na-etinye onwe ha n’ime mberede okporo ụzọ, anyị na-ahụ ọnụọgụ ndị mụrụ ọnwụ na ndị merụrụ ahụ buru ibu. Ihe mberede ndị a na-abụkarị n’ihi aghụghọ na ịghara ịgbaso iwu nchekwa okporo ụzọ n’ozuzu.
    • Violet Mathye na-agba ndị ọkwọ ụgbọala taksi ụme ka há yi beltụ ụgbọala nke ọma.

Njikọ Mpuga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: