Gaa na ọdịnaya

Sue Williamson

Sitere na Wikiquote

Sue Williamson (amụrụ na 1941) bụ onye omenkà na onye odee bi na Cape Town, South Africa. N’afọ 1948 ọ gbara obodo South Africa ọnụ na ezinụlọ ya. N’etiti afọ 1963 na 1965, ọ gụrụ akwụkwọ na Art Students League of New York. N’afọ 1983, ọ nwetara Advanced Diploma na Fine Art site na Michaelis School of Fine Art, Cape Town. N’afọ 2007, ọ nwetara Visual Arts Research Award site n’aka Smithsonian Institution dị na Washington D.C, ma n’afọ 2011 ọ nwetakwara Rockefeller Foundation Bellagio Creative Arts Fellowship. N’afọ 2013, ọ bụ onye ọbịa curator nke summer academy na Zentrum Paul Klee dị na Bern.

==Okwu ndị ọkwụrụ]]

  • "Ana m anwale iwughachi ọhụụ nke District Six ka ọ dị n’afọ ndị 1960,”
    • Work in progress: Bringing District Six back to life". TimesLIVE. Wepụtara ya na 28 March 2025.
  • "Ruo ebe o kwere mee, arụpụtara m ọrụ site na foto ochie nke edobere na faịlụ gbasara mpaghara ahụ, mbụ site n’ịkpụcha ya, mgbe ahụ itinye ink etching n’akụkụ ndị ahụ, ma n’ikpeazụ ihicha ink ahụ n’elu ya, ka naanị ink dị n’ahịrị fọdụrụ. Ejiri m ite ink m hụrụ n’ụlọ ọrụ nka m, nke sitere na afọ ndị 1980, nke onye a na-apụghị ịtụnyere, T. E. Lawrence nke London mere.”
  • "Ka m na-anọ n’ihu windo n’okpuru ihu igwe dị iche iche, na-achọ iwughachi ala ahụ nke furu efu, ọtụtụ ndị ọbịa bịara na gallery bịakwute m ka anyị kparịta ụka, cheta ncheta ha banyere District Six, ma ọ bụ jụọ m kpọmkwem ihe m na-eme.”
  • “Ọ masịrị m izute ndị a. Dịka onye omenkà, mmadụ adịghị ahụkarị ma ndị na-abịa n’ụlọ ngosi nka na-enweta mmetụta ọ bụla n’eziokwu, ma ọ bụ ma ha ghọta ihe mmadụ na-agbalị ime.”
    • “Sue Williamson's Diary: Window over a lost district”. ArtThrob. Wepụtara ya na 28 March 2025.


Okwu banyere ya

[dezie]
  • " A zụrụ Williamson dị ka onye na-ese ihe n’aAkụkụ ịkpụ akwụkwọ (printmaker), ma ọ na-arụkwa ọrụ n’ime vidiyo, foto na installation. Ọrụ ya na-ekwurịta gbasara mgbasa ozi, nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya na akụkụ nke akụkọ ihe mere eme nke oge a.”
  • Williamson na-ede na-akuzikwa ihe gbasara nka, ma ọ bụkwa onye dere akwụkwọ a ma ama ‘Resistance Art in South Africa’ (1989). N’afọ 2009, ọ bipụtara ‘South African Art Now’ (HarperCollins, New York).”
    • Guest Curator na Wayback Machine, August 21 - 31, 2013. Sue Williamson (edebanyere na March 1, 2013) Sommerakademie, wepụtara ya na 28 March 2025.


  • "N’ime ọrụ nka ya niile, Sue Williamson na-ajụ ndị na-ekiri foto ya, vidiyo ya, urban graffiti na ụdị ọrụ ndị ọzọ na-adịghị adabara n’ime otu ngalaba, ka ha tụgharịa uche n’ụzọ miri emi banyere otú na ebe ha na-ebi.”
    • Work in progress: Bringing District Six back to life". TimesLIVE. Wepụtara ya na 24 May 2023.


  • "Williamson bụ onye na-akọwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma na-ejikọta ngwaọrụ nka mara mma na eziokwu siri ike nke ndụ. Nke a yiri ihe na-emegiderịta onwe ya, ma n’ezie ọ bụ n’ime nrụgide a ka anyị na-adọta n’ime ọrụ nka ahụ, mgbe e mesịrị anyị na-apụ n’ebe ahụ na-eche echiche gbasara nsogbu ndị ahụ, n’ụzọ a onyonyo ahụ na-alaghachi dịka ederede.”
  • “Williamson haziri usoro ọmụmụ ebe ọ nyochara ike nke ebe na njirimara ya nye ụmụ amaala dị iche iche. N’ikpeazụ nke ọmụmụ ahụ, e ruru n’otu echiche banyere ụzọ kacha mma esi gosipụta mmetụta ha banyere ebe ahụ.”
    • Artsy (22 February 2016). “South African Past Is Present in Sue Williamson's New Show at Goodman Gallery”. Artsy. Wepụtara ya na 24 May 2023.

Njikọ Mpuga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: