Sonia Birdi
Ọdịdị
Sonia Birdi
Sunjeev 'Sonia' Kaur Birdi bụ onye a họpụtara na Ụlọ omeiwu Kenya. Ọ bụ nwanyị mbụ Kenya, onye Eshia jere ozi n'ụlọ omebe iwu obodo.
Okwu ndị okwuru
[dezie]- D+ n'akwụkwọ m abụghị ọdịda kama ihe m na-eweta na tebụl.
- A sị na m na-enwechaghị mmasị na mgbanwe m chọrọ ime, agaraghị m etinye akwụkwọ maka ọkwá ahụ.
- [1], Mwakilishi, March 13, 2019)
- Ọ bụrụ na ị ga-emeri n'ọkwa nhọpụta ebe ahụ, ị ga-abụrịrị 'Sonko.
- Ọchịchị bụ ọrụ enweghị nkọwa. Ị ga-ahazi ụzọ nke gị ka ị na-amụta na ọrụ.
- Anyị kwesịrị ịna-akparịta ụka, ọ bụghị iti mkpu. Agbanyeghị, ọ dị mfe ikwu karịa ime. Ndị mmadụ na-etinye ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ime nkata abụọ, nke ha nwere ike zụta na nke ha enweghị ike.
- Ekwetaghị m na ịpụ apụ bụ ụzọ kacha mma isi gosipụta nkwenye ma ọ bụ nghọtahie gị na ndị mmadụ n'okwu ụfọdụ.
- Ọ bụ ndị Kenya ka a ga ata ụta ma ọ bụrụ na ha chere na ndị ndu ha na-ahọrọ adịghị mma. Ha nwere ikike ịgbanwe nke ahụ na ntuli aka ọzọ.
- Echiche m bụ na ọ bụrụ na onye iro abata n'ụlọ gị, ọ bụghị naanị nọdụ ala na-atụ anya na ọ ga-apụ n'udo. Ị ga-amanye onye iro ahụ.