Shakira
Ọdịdị

Shakira Isabel Mebarak Ripoll (a kpọrọ: Templeeti:IPA, English Templeeti:IPA; a mụrụ Febrụwarị 2, 1977) bụ ọgụ egwu, ode egwu, ọgba egwu, onye na-arụpụta rekọọdụ, koriografa, na modeelu si Colombia. A mụrụ ya ma zụlite ya na Barranquilla, ọ malitere mewe ihe ngosi n'ụlọakwụkwọ, na-egosipụta emume Latin, nke ndị Arab, mgbasa rọk na rol na ijinwu afọ gbaa egwu.
Ihe o kwuru
[dezie]- Ana m eche na aga m eji olu m kwuchitere ndị enweghị. Aga m eme ka m nwere ike inọchite anya omenala m, nọchite anya ụmụnwanyị mbà m, nke Latin Amerịka. Ihe anyị nọchitere anya ya. Ihe anyị bụ. Ana m eche na e nwere akụkụ m na-anọchite anya ndị enweghị ọnụ na US, onye enweghị ọnụ n'ụwa gbara gburugburu. Ndị mmadụ ndị na-agba mbọ, ndị mmadụ ndị na-achọ ịlafe site na mmasị na ịṅa ọkụ n'obi ịbụ ihe ha chọrọ ịbụ. Ya bụ, ndị mmadụ chọrọ ịnwali – eee, ana m eche n'otu akụkụ dị ka onye nnọchiteanya, nyere ndị ahụ niile.
- Ọ bụ ebe e nwere óké ìgwè mmadụ a chụpụrụ n'ụlọ – ndị bịara abịa ịchọ nchekwa na mbà nke ha. Ọ bụ ebe óké ụbịam dị, ebe ụmụaka enweghị ohere na nhazi agụmakwụkwọ dị mma ma ọlị. Ya bụ, anyị ebidola ụlọakwụkwọ a maka ụmụ akwụkwọ 1,700. Ọ malitela igosi ike mgbanwe agụmakwụkwọ nwere. Ọ malitela na-enwe óké mmetu n'ahụ nke ọha n'ógbè a. Tupu ụlọakwụkwọ a dịrị, e nweghị ụzọ a wụrụ awụ, ma ọ bụ mmiri dị mma ọṅụṅụ, ma ọ bụ ọkụ latrịk. Mana ugbu a, ihe a niile agbanweela, site na nrụkọrịta a dị n'etiti otu ọrụ, akụkụ nke onwe, gọọmenti [etiti] na gọọmenti ime obodo. Mana ị ma, a kọrọ na nso nso a na ndị ajọ otu ahụ na-akwụghari n'ógbè e nweghịzi nke a na-ahụ kemgbe a rụchara ụlọakwụkwọ ahụ. Ya bụ, ọ bụ ụdị mmetu n'ahụ nke ọha a ka ọrụ ndị a nwere. Ọ bụ maka nke a ka m ji obi m niile na-ekwusi okwu ike maka agụmakwụkwọ ya na maka ịrụ ụlọakwụkwọ dị ka ndị a na-ahụ n'ebe ọzọ – na nke onye ọ bụla nọ n'obodo ahụ ga-aganwu ... Ọ bụ ya bụ ezi ebumnobi niile nke anyị nwere na ntọala ọrụ a.”
- N'ikwu maka mmalite agụmakwụkwọ ya, Pias Descalzos (Barefoot), aha nke a gụrụ maka alụbọọm ya nke atọ, nakwa na ọ ka meghechara ụlọakwụkwọ nke isii ya na Cartagena, Colombia.
- Ana m eche oge niile na e kwesịrị inwe [karịa] naanị... ịnyọ ya, ị ma, ndụdụgandụ. Ma ọ bụ naanị na-eme ègwú. Ma ọ bụ karịa inwe ezigbo obi aṅụrị site n'ịkpa mmadụ obi ụtọ – nọrọ na nkwago nke bụ óké ọgbụgba nke adrenalin. Mana Aga m enwe ihe ọzọ ga-adị na ndụ m. Ya mere na ana m eche na ọrụ a m na-arụ ga-eme, ọ bụ etu ahụ ka ndụ m ka esi zuo ike. Nakwa etu m si achọta isi ndụ mụ onwe m dị. Ana m echekwa na égwú bụ nkwago ahụ. Ọ bụrụla ụgbọ nke hapụrụ m ka m jiri olu m kwuo maka ihe ndị ahụ chọrọ nlebanya ozigbo ozigbo. Aga m enwenwu uche ndị mmadụ ahụ dị n'ebe m nọ, kwajere ya ihe ndị ahụ kacha dị mkpa nke ukwuu karịa ihe gbara onwe m.
- Ana m eche oge niile na e nwere ihe ndị dị na ndụ ga-ahapụ m, dị ka mmá, ntorobịa, ihe niile dị etu ahụ...Mana echeghi m na olu m ga-ahapụ m, maka na ọ dị̀ká n'ihe m jiri bụrụ mmadụ. Ọ bụ njirimara m. Ya bụ, mgbe m anaghị agụnwu égwú, o kweghi m odidi. E nwe oge m anaghị ebilitenwu n'ákwà ụra – ike ụwa gwụrụ m.
- On almost losing her voice following a vocal hemorrhage in “Shakira: 'I needed surgery – or divine intervention'” in The Guardian (2019 Nov 11)
- Ị na-apụ apụ achọ ndị ga-ekwenyere gị na ị dị mmá, na ndị mmadụ hụrụ n'anya. Mana n'oge a ọ dị iche – Anọ m ebe ahụ maka na achọrọ m inweta ihe ụtọ nke ịgụ égwú.
- On singing again after her health scare in “Shakira: 'I needed surgery – or divine intervention'” in The Guardian (2019 Nov 11)
- Ọ dịịrị ọ̀gụ́ égwú. Ana m eche na ụfọdụ ndị ọ̀gụ́ égwú kwesịrị ịnọ ma ụfọdụ ga-afụna. Ọ na-eme mgbe niile. Ọ bụ nhọpụta ụdịdị ihe nke èkè. Mana anaghị m ahụ ya ka mbawanye n'égwú Latin. Eche m na ụwa nọ n'ebe ụzọ. Ụzọ soshul midia gosiri na ọ bụghị naanị redio ga-ekpebi egwu nke ga-ewu ewu. Ọ bụ ndị mmadụ.
- On whether Latin music is experiencing a resurgence in the 2010s in “Shakira on her vocal problems: 'I doubted I'd ever sing again'” in BBC News (2018 Jun 10)
- Ana m ebi ndụ site n'ọnụ. Anya adịka na chọkọleti, okwu e kwuru n'ọnụ, ihe ndị m kwuru na ihe m ndị mụ ekwesịghị ikwu.
- On what she considers her oral fixations in “Shakira” in Outlook India Magazine (2007 Apr 9)
