Gaa na ọdịnaya

Scott Nearing

Sitere na Wikiquote
Scottnearing

Scott Nearing

(amụrụ ọnwa Ọgọst 6,afọ 1883 - Ọgọst 24, 1983) bụ onye ọka mmụta akụ na ụba America na onye edemede.

Okwu ndi okwuru

[dezie]
  • Mee ike gị niile n'ebe ị nọ, nweekwa obi ọma.
  • Agha na-adọkpụrụ ụmụ mmadụ site n'ọrụ ha na-ewu na imeziwanye, ma na-akwanye ha n'ìgwè n'ụdị nke ndị na-ebibi ihe na ndị na-egbu mmadụ.
  • Ọchịchị gị abụghịzi nke m.

[1], Brainyquote.com

  • Ndị isi na afọ niile etinyela ndị ikom dị ka Debs n'ụlọ mkpọrọ n'ihi na ọ bụ onye na-ekwu eziokwu ka ndị nna ukwu na-atụ egwu. Ha na-atụ egwu eziokwu; ha nātu egwu Ìhè; ha na-atụ egwu ikpe ziri ezi; na onye na-atụgharị n'ìhè ahụ na-ekwu eziokwu na-eti mkpu maka ikpe ziri ezi-bụ onye iro ha kasịnụ. Ya mere, ha na-anwale usoro a nke itinye echiche n'ụlọ mkpọrọ mgbe niile.
  • E jiri ya tụnyere mkpa ọ dị ichebe ihe ùgwù na ikike ndị ọchịchị, ikike mmadụ nwere ikwupụta uche ya bụ ihe efu. Nke ahụ bụ ihe mmụta nke akụkọ ihe mere eme na nke ahụ bụ ihe anyị na-ahụ taa. Ndị ikom kpalitere ndị mmadụ;ndị ikom weliri olu ha na mkpesa; ndikom ndi nēche echiche ziri ezi; ndị ikom hụrụ mmadụ ibe ha n’anya nke ukwuu; ndị ikom nwere nkwenye na obi ike na nzube; ndị ikom dị njikere ịrapagidesi ike n'echiche ha—ndị ikom dị otú ahụ atawo ahụhụ n'oge ọ bụla.
  • Aghọtara m onye anaghị eri anụ n'ihi na e mere ka m kwenye na ndụ bara uru maka ihe ndị ọzọ e kere eke dị ka ọ dịkwa mmadụ. Achọghị m ozu anụ ọhịa iji mee ka m dị ndụ, gbasie ike na ahụ ike. Ya mere, agaghị m egbu maka nri.

[2], Libquotes.com

Njikọ mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: