Gaa na ọdịnaya

Sardar Vallabhbhai Patel

Sitere na Wikiquote
Sardar Patel in 1949

Vallabhbhai Patel (amụrụ 31 n'ọnwa Ọktoba afọ 1875 - 15 Disemba 1950) bụ onye isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta ọha na eze nke India na mgba ya maka nnwere onwe, a na-akwụkwa ya maka inweta njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke India.Na India na n'ofe ụwa, a maara ya dị ka Sardar Vallabhbhai Patel, ebe Sardar na-anọchi anya Chief n'ọtụtụ asụsụ India.

Okwu ndi okwuru

[dezie]
  • Ike na-enweghị Ịdị n'Otu abụghị ike ọ gwụla ma ọ kwadoro ma jikọta ya nke ọma, mgbe ahụ ọ na-aghọ ike ime mmụọ.
  • Ọ bụ nnukwu ọrụ dịịrị nwa amaala ọ bụla iche na obodo ya nweere onwe ya na ịgbachitere nnwere onwe ya bụ ọrụ ya. Onye India ọ bụla kwesịrị ichefu ugbu a na ọ bụ Rajput, onye Sikh ma ọ bụ Jat. Ọ ga echeta na ọ bụ onye India na o nwere ikike na obodo a mana ọ nwere ọrụ ụfọdụ.
  • Ọbụlagodi na anyị tụfuru akụ na ụba nke puku kwuru puku, na ndụ anyị a chụrụ n'àjà, anyị ... kwesịrị ịnọgide na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-enwe obi ụtọ na-edebe okwukwe anyị na Chineke na eziokwu.
  • Ndị isi India nọọrọ onwe ha agaghị eji asụsụ mba ọzọ ma ọ bụ chịa site n'ebe dịpụrụ adịpụ.
  • Ọ dịghị onye agụru ga- agụụ na India nwere onwe ya. A gaghị ebupụ ọka ya na mba ọzọ. Agaghị eji ya ebubata akwa. Ndị ndú ya agaghị eji asụsụ mba ọzọ na-achọta ikpe ziri ezi na ya agaghị abụ ọnụ ahịa ma ọ bụ ihe siri ike.


Njikọ mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: