Gaa na ọdịnaya

Ruth Chapman

Sitere na Wikiquote

Ruth Elizabeth Chapman OBE (amụrụ na Disemba 1961) bụ onye guzobere na onye bụbu onye isi nchịkwa ọnụ nke MATCHESFASHION.COM, ụlọ ọrụ na-ere uwe na ngwa ejiji okomoko.

Okwu ndị ọkwụrụ

[dezie]
  • Ihe ike uwe nwere na otú ejiji si agbanwe ma na-etolite na-adọrọ m mmasị mgbe niile. M na-eji ụbọchị Satọdee m aga na ụlọ ahịa uwe eji emegharị emegharị, na-achọgharị ihe dị iche iche, ma na-echekwa ego iji zụta ihe ndị m na-enweghị ike ịzụta ozugbo.[1]
  • (Weebụsaịtị ahụ) bụ maka inye ndị ahịa anyị nhọrọ, ma n'ezie, ozugbo ọ pụtara n’ịntanetị, ọtụtụ ndị ọzọ hụrụ ihe ha hụrụ n’anya ma zụta ngwaahịa niile.[2]
  • Anyị chọrọ ndị na-etinye ego bụ ndị ghọtara na ọ bụghị naanị azụmahịa n’ịntanetị ka ihe dị mkpa. Anyị hụrụ ezigbo mmasị n’ụlọ ahịa a na-ahụ anya dịka ebe ndị ahịa na-abịa, ma nke ahụ ka bụ eziokwu .[3]
  • Ọnọdụ ego na-abata na-apụ na-abụkarị nsogbu mgbe niile. E nwere oge mgbe ị na-azụlite ezinụlọ, na-akwụ ụgwọ ụlọ , ma ụlọ akụ na-anọgide na-akpali gị; ị na-agafe ya n’agbanyeghị ihe isi ike—ma n’ezie, e nwere oge ị na-eche, ‘Oh Chukwu nke a adịghị mma’ Ma nke ahụ bụ naanị akụkụ nke azụmahịa.[4]
  • Mgbe ị nọ n’ime ihe, ị gaghị ewere ihe ọ bụla dị ka ihe a na-apụghị ịgbanwe. Ire ụlọ ọrụ ahụ bụ n’ezie oge dị ukwuu nyere anyị, ma ịnọ n’akụkụ nke ọzọ nke ahụ, anyị nwere nnukwu nganga maka ihe anyị rụzuru. Ma ọ bụrụ na mmadụ aghọọ onye na-eleda ihe anya ma nwee afọ ojuju nke ukwuu n’otu oge, ihe nwere ike gbanwee ngwa ngwa ma ihe nwekwara ike ịga n’ụzọ na-adịghị mma.[5]
  • Ihe na-adọrọ mmasị gbasara ejiji bụ na ọ bụrụ na ndị mmadụ chọrọ ihe, ha na-achọ ya n’eziokwu.[6]
  • Anyị na-arụ ọrụ mgbe niile ka ụda nke anyị, na-ekpebi ihe anyị ga-eme ma mee ya. Nke ahụ bụkwa ihe kacha mma anyị nwere ike ime. [7]


Njikọ mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: