Olayinka Olusola Omigbodun
Ọdịdị
Olayinka Olusola Omigbodun bụ nwanyị Naịjirịa mbụ bụ Prọfesọ n’ọhịa Mmụba uche mmadụ (Psychiatry). Ọ bụ Prọfesọ n’ụlọ akwụkwọ ọgwụ, Mahadum Ibadan, Ibadan, Naịjirịa. Ọ bụkwa nwanyị mbụ ghọrọ prọvost nke Ụlọ Akwụkwọ Ọgwụ, Mahadum Ibadan.
Okwu okwuru
[dezie]- Aka ede bụ ihe dị mkpa n’ịmụ ihe. Dị ezigbo mkpa. Ma oge bụ ihe kachasị mkpa iji kwe ka nwa mụta n’ogo ya n’onwe ya.[1] Prof. Olayinka Olusola kwuru na ịkụziri ụmụaka praịmarị ide ihe n’ike abụghị ihe bara uru.
- Anyị kwesịrị inwe atụmatụ kwesịrị ekwesị, ọ gaghị ekwesị ịdị n’aka otu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n’ọkwa. Ọ ga-abụ ihe e setịpụ iji rụọ ọrụ dị ka iwu ọrụ ndị ọha, ka ihe ghara ịdaba n’ọnọdụ mgbagwoju anya. Nke a bụ ihe obodo nwere ọdịbendị na-eme.
- Mgbe ị na-ewu usoro, ọ dị mkpa ka e nwee usoro maka nyocha na ịrụ ọrụ nke ọma na ogologo oge.
- Enwere m atụmatụ akpọrọ TOGETHER AGENDA. Ọ bụla n’ime mkpụrụedemede ndị ahụ na-anọchite anya otu akụkụ nke m chọrọ ịkụziri. T pụtara ịbụ ọnụ site na mkparịta ụka obodo na imekọ ihe ọnụ. O pụtara ịkwalite mmepụta na ọnọdụ ọrụ ndị ọrụ. G bụ ịkwadebe ụmụ akwụkwọ anyị ka ha dị njikere maka ọkwa ụwa. E pụtara ịkụziri echiche ụwa niile. Nke ọzọ T pụtara ịmekọrịta na UCH na akụkụ ndị ọzọ nke UI. H bụ iji ike ndị ọlụmụnya na-eme ihe na E pụtara ịgbasawanye ego anyị. R bụ ịkpọpụta ihe na obodo. [2] Prof. Olayinka Olusola kwuru na ịkwado ego na ime atụmatụ maka nnyefe ahụike kwesịrị ịbụ nke enweghị ime ndọrọndọrọ ọchịchị.
- Atụmatụ m nke iwu doro anya nke ọma ma zuru oke, ọ bụkwa nke mere m ji mee mkpụrụokwu TOGETHER, anyị niile nọ na nke a ọnụ, ma ihe ịga nke ọma dabere na mgbalị anyị niile. [3] Prọfesọ Omigbodun Laghachiri Ọrụ Dị Ka Prọvost Nwanyi Nke Mbụ Na Kọleji Ọgwụ, Mahadum Ibadan.
- Anaghị m enwe obi abụọ na Naịjirịa nwere nnukwu ikike, ma ana m atụ anya ịhụ ọtụtụ ndị nọ n’ala anyị ga-akwado ịdị n’eziokwu, ikpe ziri ezi na eziokwu. N’ebe m nọ, achọrọ m isonyere na iwulite ala a, na ịpụta nke Naịjirịa ọhụrụ.
Ụfọdụ ndị na-eme nke ọma na-adịkarị n’ọnọdụ mgbochi. A ga-enwe mgbe niile ndị na-adịghị akwado echiche mmadụ, ma ha ga-eme ka ihe sie ike karịa ka ọ kwesịrị ịbụ. [4] Ntụle nke Prof. Omigbodun.
Njikọ mpụga
[dezie]- ↑ https://tribuneonlineng.com/forcing-preschoolers-to-write-is-pointless-dangerous-prof-omigbodun-child-psychiatrist/
- ↑ https://guardian.ng/guardian-woman/funding-planning-for-healthcare-delivery-should-be-devoid-of-politicking/
- ↑ https://oyoinsight.com/photos-omigbodun-resumes-as-first-female-provost-of-ui-college-of-medicine/
- ↑ https://punchng.com/im-privileged-to-be-first-female-psychiatry-professor-prof-omigbodun/?amp
