Monica Harding

Monica Harding bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Britain n’ụlọ ọrụ 'Liberal Democrat', bụrụkwa onye nọchiri anya 'Esher and Walton' dịka MP (Onye Omebe iwu) kemgbe afọ 2024. Tupu ọbanye n’ime ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Harding bụ onye ndụmọdụ njikwa, ma bụrụkwa Director na CEO nke ụfọdụ òtù dị na Europe na Asia.
Okwu ndị o kwuru
[dezie]1. "Ọ tọrọ m ezigbo ụtọ ileta Weston Green School n’izu a, karịchaa mkparịta ụka m na ndị otu Kansụl Ụlọ Akwụkwọ ahụ. Ụmụ akwụkwọ ndị a nọ na klas nke atọ ruo nke isii kesara m echiche ha gbasara otu e si agbanwe obodo anyị ka ọ bụrụ ebe ka mma. Ha nwere ụfọdụ echiche ọhụrụ na amamihe gbasara ebe obibi (ụlọ), ha gosikwara nnukwu mmasị n’ichekwa gburugburu ebe obibi, ma na-echekwa ma hụ obodo ha n’anya nke ukwuu".
2. "Ọ bụ nnukwu ihe ụtọ nye m ije ozi n’okpuru ọchịchị gị dịka onye isi oche, Nwada Butler. Ekele m pụrụ iche na-agara onye omeiwu na-anọchite anya Newport West na Islwyn, Ruth Jones, maka ịhazi mkparịta ụka a, nke dị mkpa nke ukwuu ma bụrụkwa nke dabara adaba n’oge a. Obi dị m ụtọ ikwu okwu taa ka anyị na-akwado ịga ezumike emume Ista".
3. “Ikike mmadụ nwere ịrụ ma gosipụta okwukwe ya n’enweghị mgbochi ma ọ bụ ịkpa ókè bụ otu n’ime ikike ndị bụ ihe dị mkpa.Ndị Liberal Democrats nwere akụkọ ihe mere eme nke na-egosi nkwado siri ike ha na-enye maka nnwere onwe na nha anya nke mmadụ niile n’ụwa, n’agbanyeghị ọdịiche ha".
4. Anyi kwenyere na mmadụ niile kwesịrị inwe ike ibi ndụ ha n’enweghị ụjọ ọ bụla, gụnyere ụjọ nke ekweghị n’okwukwe ma ọ bụ ịkpa ókè n’ihe gbasara okpukperechi. Anyị kwenyekwara na ikike mmadụ bụ nke metụtara mmadụ niile n’ebe ọ bụla ha nọ, nakwa na Universal declaration of human rights, nke na-echekwa nnwere onwe nke echiche, akọnuche, okwukwe na omume okpukperechi, ka nwere otu uru na mkpa ahụ taa dịka o nwere mgbe e guzobere ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri asatọ gara aga..”
5. “Ọ bụ ihe nwute ịhụ na ndị Kraịst n’ụwa niile na-ata ahụhụ, ma ihe ka njọ, ịmata na maka ọtụtụ n’ime ha ọnọdụ ka na-adị njọ. Taa, ihe dịkarịa ala nde mmadụ 318 nke Kraịst bi n’ụzọ nke jupụtara na nrụgide na ịkpa ókè — nke ahụ abawanyela site na pasent 12 n’afọ 2021.”
6. “Tụkwasị na nke ahụ, ọnụ ọgụgụ mba ndị *Open Doors* na-atụle dị ka ndị na-eme nnukwu nrụgide megide Kraịst abawanyela ugboro atọ n’ime afọ iri gara aga, site n’ime mba 23 ruo n’ime mba 60.”
