Monica Harding
Nkọwa ndụ
Monica Harding bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Britain n’ụlọ ọrụ 'Liberal Democrat', bụkwa onye nọchiri anya 'Esher and Walton' dịka MP (Onye Omebe iwu) kemgbe afọ 2024. Tupu ọbanye n’ime ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Harding bụ onye ndụmọdụ njikwa, ma bụrụkwa Director na CEO nke ụfọdụ òtù dị na Europe na Asia.
Okwu sitere n’ọnụ Monica Harding
1. “Ọ masịrị m nke ukwuu ileta Weston Green School n’izu a, ọkachasị mkparịta ụka m nwere na 'School Councillors'. Ụmụaka ndị a site n’afọ klas 3 ruo 6 kesara m echiche ha gbasara otu esi agbanwe obodo anyị — ha nwere echiche ọhụrụ gbasara ụlọ obibi, gosipụtara mmasị siri ike n’ịchekwa gburugburu ebe obibi, ma bụrụkwa ndị nwere obi ebere maka obodo ha nke nta.”
'(Monica Harding zutere School Councillors)'
2. “Ọ bụ ezigbo ihe ụtọ ịbụ onye na-ejere n’okpuru nlekọta gị, Ms Butler. Ekele m nye onye omebe iwu nke Newport West na Islwyn (Ruth Jones) maka iweta mkparịta ụka a, nke dị mkpa nke ukwuu ma kwekọrọ oge — obi dị m ụtọ ikwu taa ka anyị na-apụ na ezumike Easter.”
3. “Ikike ịrụ okpukpe mmadụ n’efu, na-enweghị mgbochi ma ọ bụ ịkpa ókè, bụ isi ihe. 'Liberal Democrats* nwere akụkọ ọma nke *liberal universalism'.”
4. “Anyị kwenyere na mmadụ niile kwesịrị inwe ikike ibi ndụ ha n’enweghị ụjọ, gụnyere ụjọ nke ịkpa ókè megide okwukwe; na ikike mmadụ metụtara onye ọbụla n’ebe ọbụla; na Universal Declaration of Human Rights, nke kwadoro nnwere onwe echiche, nghọta, okwukwe, na omume okpukpe, ka nwere otu olu siri ike taa dịka o nwere mgbe e kwadoro ya ihe fọrọ afọ 80 gara aga.”
5. “Ọ bụ ihe nwute ịhụ na ndị Kraịst n’ụwa niile na-ata ahụhụ, ma ihe ka njọ, ịmata na maka ọtụtụ n’ime ha ọnọdụ ka na-adị njọ. Taa, ihe dịkarịa ala nde mmadụ 318 nke Kraịst bi n’ụzọ nke jupụtara na nrụgide na ịkpa ókè — nke ahụ abawanyela site na pasent 12 n’afọ 2021.”
6. “Tụkwasị na nke ahụ, ọnụ ọgụgụ mba ndị *Open Doors* na-atụle dị ka ndị na-eme nnukwu nrụgide megide Kraịst abawanyela ugboro atọ n’ime afọ iri gara aga, site n’ime mba 23 ruo n’ime mba 60.”
(Okwu Monica Harding n’ụlọ omebe iwu Britain)