Mavis Owureku-Asare
Ọdịdị
Mavis Owureku-Asare bụ onye Ghana bụ ọkàmmụta na sayensị nri.
Okwu Ndị O Kwuru
[dezie]- Anyị nwere ike ibido site n'inye ezinụlọ anyị nri karịsịa ụmụaka site n'iji ụfọdụ ọka na nri emere n'ime obodo dịka "asana", "nkati cake", "kube toffee", na "adakoa" nke a na-esi na ọka, ahụekere na ngwá nri ndị ọzọ eme, nke na-edozi ahụ nke ukwuu karịa ụfọdụ nri ndị arụgharịrị arụgharị a na-ebubata na ala a (Ghana) site na mba ndị ọzọ.
- Samuel Hinneh, Onye ọkà mmụta sayensị nri emepụtara ndị na-emepụta nri uru asọmpi, Ghana Web, 4 Jun 2016.
- Vitamin C na-agbari ngwa ngwa na mgbé okpomọkụ ma na-esi na mkpụrụ osisi ekupusi ngwa ngwa. Kedu ihe bụ oroma ma ọ nweghị vitamin C?
- Ahịa Accra na-eresị ndị na-azụ ahịa ihe nri 'dị ize ndụ' - Nchọpụta, Ghana Web, Mee 3, 2019.
- E mepụtara m igwe na-akpọ ihe nkụ na-eji ike sitere n'anyanwụ site n'iji ihe ndị dịnụ, iji gbanwegharịa tomato ndụ ka ọ bụrụ tomato ntụ ntụ nwere ọnụahịa dị elu nke e nwere ike ịmegharị ka ọ ghọọ tomato nkọta a ga-eji na-esi nri.
- Masahudu Ankiilu, Ijikọ ime nnyocha na ụlọ ọrụ enweghị ka ọ bụrụ ọrụ dị mfe, mana Dr Mavis Owureku-Asare na-egosi ụzọ esi eme ya, African Eye Report, November 20, 2020.
- Anyị dịka ndị ọkà mmụta sayensị dịka anyị a na-aka elekwasị anya nke ukwuu na ọrụ nnyocha anyị mana anyị kwesịrị ịchọpụta ụzọ anyị ga-esi kwalite ihe nlụpụta nnyocha anyị. Nke a na-achọ inwe akara ngosi na mkparịtaụka dị irè nye ndị na-azụ ahịa na ndị isi ihe.
- Masahudu Ankiilu, ime nnyocha na ụlọ ọrụ enweghị ka ọ bụrụ ọrụ dị mfe, mana Dr Mavis Owureku-Asare na-egosi ụzọ esi eme ya, African Eye Report, November 20, 2020.
- Ọ bụụrụ ihe kwesịrị ka m mee iwụfe ọtụtụ ihe mgbochi iji ruo ebe m nọ ugbu a, ọ dịghịkwaara mfe dị ka onye ọkachamara, nwunye na nne ma ihe na-eme ka m na-aga n'ihu bụ akụkọ ịme nke ọma nke ndị na-emepụta nri na ndị ọrụ ugbo m na-elebara anya kwa ụbọchị. Ha bụ ihe mkpali mmụọ m—A hụrụ m ụ́sà ndị dị mfe itinye n'ọrụ m na-enye nke nwere ike imeziwanye azụmahịa ha na ebe obibi ha n'anya.
- ime nnyocha na ụlọ ọrụ enweghị ka ọ bụrụ ọrụ dị mfe, mana Dr Mavis Owureku-Asare na-egosi ụzọ esi eme ya, African Eye Report, November 20, 2020
- Amaaraghị m ma m ga-anọ n'ụlọ ọrụ isi nri ka ọ̀ bụ na m ga-anọ n'ịzụ ahịa ihe oriri. Mana dị ka nwa akwụkwọ sayensị izugbe na Wesley Girl’s High School, achọpụtara m site na mmekọrịta mụ na onye na-ahụ maka nri, na enwere ike mụọ nri dịka sayensị. Yabụ, enwere m ike ịghọta nri karịa n'ihi na ọ gafere ịchọ ya mma. Enwere sayensị na ya.
- Masahudu Ankiilu, ime nnyocha na ụlọ ọrụ enweghị ka ọ bụrụ ọrụ dị mfe, mana Dr Mavis Owureku-Asare na-egosi ụzọ esi eme ya, African Eye Report, November 20, 2020
- Ọ gaghị abụrịrị ịmụ maka ọgwụ. Ị maara ka nne na nna anyị na ọha mmadụ na-atụ anya na ozugbo ị bụ nwa akwụkwọ sayensị, mgbe ahụ nhọrọ kachasị mma bụ ịbụ dọkịta ahụike. A na m asọpụrụ ngalaba ahụike nke ukwuu mana echere m na nrụgide a anyị na-arụgide ụmụ anyị ka ha bụrụ dọkịta ahụike na-enwe mmetụta ọjọọ n'ahụ ụmụ anyị karịsịa mgbe ha na-enweghị ike inweta ákàrà ngafe ga-eduba ha n'ụlọ akwụkwọ ahụike. Ịkwesighi ịbụ dọkịta ahụike ka ị bụrụ onye kachasị mma ị nwere ike ịbụ dịka nwa akwụkwọ sayensị.
- Masahudu Ankiilu, ime nnyocha na ụlọ ọrụ enweghị ka ọ bụrụ ọrụ dị mfe, mana Dr Mavis Owureku-Asare na-egosi ụzọ esi eme ya, African Eye Report, November 20, 2020
- Achọrọ m ịkpali ụmụ agbọghọ na STEM ikwere na ọ ga-ekwe omume ịchụso akaraka na-eju afọ n'ọ̀zụ̀zụ̀ sayensị ọ bụla.
- Masahudu Ankiilu, ime nnyocha na ụlọ ọrụ enweghị ka ọ bụrụ ọrụ dị mfe, mana Dr Mavis Owureku-Asare na-egosi ụzọ esi eme ya, African Eye Report, November 20, 2020
- Ọ bụ oku ịrụ ọrụ ka anyị kèrè òkè n'iduzi ọ̀gbọ́ na-abịa. N'ihi na sayensị adịghị mfe, tinye na ọtụtụ mmadụ na-enwekwa nkụda mmụọ n'ụzọ. Enwere m mmasị n'ezie ime nke ahụ.
- ime nnyocha na ụlọ ọrụ enweghị ka ọ bụrụ ọrụ dị mfe, mana Dr Mavis Owureku-Asare na-egosi ụzọ esi eme ya, African Eye Report, November 20, 2020
