Maha Ashour-Abdalla
Ọdịdị
Maha Ashour-Abdalla (Arabic: مها عاشور عبدالله, 1943 – May 1, 2016) bụ onye Egypt mụrụ physics na astronomy prọfesọ. Akpọrọ ya aha onye otu American Physical Society na 1986 na nke American Geophysical Union na 1993. A mụrụ ya Maha Ashour na Mahadum Alexandria. Ọ nwetara PhD na Imperial College London na 1971
Okwu Ndị okwuru
[dezie]- M na-aga na nzọụkwụ otu otu, n'agbanyeghị ogologo oge ọ ga-ewe. Ọ dị ka iso ha na-agba ọsọ, ume na-agwụkwa gị mgbe ụfọdụ, mana ọ bara uru ma anyị mee ya n'ọgwụgwụ.
- Ka anyị kwuo eziokwu: ụmụ akwụkwọ sayensị kacha mma ga-amụta n'ụzọ ọ bụla. Ha adịghị mkpa ịkwanye. Ọ masịrị m ịkụziri ụmụ akwụkwọ ndị kpọrọ physics asị. M na-agwa ha ka ha ghara ịtụ egwu. Ha niile nwere ike ime ya ozugbo ewepụrụ egwu ahụ. "
- Ọ na-atọ m ụtọ iso ndị na-agụsị akwụkwọ na-arụkọ ọrụ, ọ dịghịkwa ihe na-enye m obi ụtọ karịa ịhụ ka nwa akwụkwọ ghọtara onye na-enwe ihe isi ike
- Ụmụ akwụkwọ anyị agaghị anabata ya ma anyị guzoro otu ebe; anyị ga-atụfu ha. M na-amụta aha ụmụ akwụkwọ ma na-agba ha ume isonye. Ana m arịọ ndị ọrụ afọ ofufo ka ha gaa na bọọdụ. Oge mbụ, ụmụ agbọghọ ga-asị, 'Agabeghị m bọọdụ.' Asim, ‘Sorom, echegbula; nyere m aka.'"
