Lucy Anin
Ọdịdị
Lucy Anin
Lucy Anin (amụrụ 13 n'ọnwa Junn afọ 1939) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ghana. Ọ bụ onye nzuko omeiwu na-anọchite anya Brong Ahafo Region site na 1960 ruo 1965 na onye omeiwu maka mpaghara Bechem site na 1965 ruo 1966.
Okwu ndị okwuru
[dezie]- M sonyeere ụlọ akụ̀ azụmahịa ruo oge ụfọdụ wee banye n’ụlọ omeiwu ozugbo, n’ihi ya, adị m afọ iri abụọ na atọ mgbe m ghọrọ onye omeiwu
- [1] Exclusive interview with Lucy Anin
- Ghana nke taa nwere nnukwu mgbagwoju anya. Ihe m ga-ekwu bụ ma ọ bụrụ na anyị agbanweghị iwu 1992 anyị n'ihi na iwu a nwere sọ ọtụtụ ntụpọ, na iwu a na-amanye ndị Ghana ogologo oge egwu nke ọchịchị PNDC na NDC. Yabụ na ọ bụghị iwu maka ndị mmadụ, a ga m akpọ ya iwu JJRolins.
- [2]Exclusive interview with Lucy Anin
- Usoro iwu ahụ mgbe mbụ e depụtara ya bụ 1992 ọ bụ nkebi iwu akwadoro.
- [3]Exclusive interview with Lucy Anin]
- Anyị ekwesịghị ịkwado ọchịchị nchipu ma ọ bụrụ na anyị na-ekwu maka ọchịchị ndị nkịtị, anyị kwesịrị ịgbanwe akwụkwọ iwu a dị ugbu a nke ndị mmadụ jiri uru wee were ụlọ ọrụ steeti niile, akpụkpọ ụkwụ steeti, imekọ ihe ọnụ nke steeti, anyị na-enwebu ụlọ ahịa GNDC nke bụ ebe a na-emepụta ngwaahịa Ghana.
- [4]Exclusive interview with Lucy Anin
- Nnwere onwe maka Ghana pụtara na anyị bụ steeti ọhụrụ anọghị n'okpuru mmadụ, ị nọọrọ onwe gị, ị nwere ike ịme mkpebi nke gị, ịgaghị ekwe ka mmadụ kpebiere gị.
- [5] Reshaping Ghana's destiny demands discipline
- N'oge a, mgbe ị gara ụlọ akwụkwọ, ị wee jụọ ha (ụmụ akwụkwọ)ihe ọbụna gbasara akụkọ ihe mere eme nke anyị, ha amaghị maka ya ma ha na-amụ akụkọ ihe mere eme banyere obodo ha.
- [6] Ịmeghari ọdịnihu Ghana chọrọ ịdọ aka ná ntị
- Anyị kwesịrị ịgbanwe ya (usoro iwu) n'ihi na akwụkwọ iwu nwere nkebi iwu nkwụghachi ụgwọ kpuchiri ndị zuru ego obodo a.
- [7] Reshaping Ghana's destiny demands discipline
- M na-ekwu na anyị kwesịrị ịgbanwe okwu nkwụghachi ụgwọ dị na akwụkwọ iwu 1992 , kedu ka ị ga-esi kwado ọchịchị nchigbu?.
- [8] Reshaping Ghana's destiny demands discipline
- Ọ bụrụ na anyị agbanweghị akwụkwọ iwu, ị nweghị ike itinye onye ọ bụla n'ụlọ ikpe maka ịkwakọrọ ihe, ọ bụ ya mere m ji na-ekwu na anyị enweghị ike ịkwụsị nrụrụ aka n'ihi na ndị mmadụ kpuchiri ụgwọ n'iwu anyị.
- [9] Reshaping Ghana's destiny demands discipline
- Anyị nwere nnọọ ngọzi ma anyị kwesịrị ị na-ebupu ọtụtụ ngwaahịa ugbo kama ibubata, anyị nwere ike na-emepụta nri zuru ezu ma ọ bụrụ na anyị na-etinye uche anyị na ya.
Reshaping Ghana's destiny demands discipline
