Kirsten Bodley
Ọdịdị
Kirsten Bodley bụ onye Britain ma bụrụ onye isi nlekọta ugbu a nke Institute of Asset Management, na onye bụbu onye isi oche nke Women's Engineering Society.
Okwu ndị ọkwụrụ
[dezie]- “N’oge ọnọdụ a dị otú ahụ, otu ụmụ nwanyị guzobere Women’s Engineering Society. Ha mere nke a ọ bụghị naanị iji guzogide nrụgide ahụ, kama iji kwalite ọrụ injinia dịka ọrụ bara uru ma na-enye afọ ojuju nye ụmụ nwanyị dịka ọ na-adịkwa nye ụmụ nwoke.” [1]
- “Ọrụ ụlọ na-achọkarị nnukwu mgbalị na ọrụ ike n’oge gara aga. Ma mgbe ọkụ eletrik bịara, ibu ọrụ ahụ belatara, nke mere ka ụmụ nwanyị malite ịchọ ọrụ n’èzí ụlọ.” [2]
- “E nwere ohere ndị na-atọ ụtọ maka mmadụ niile, n’agbanyeghị ebe ha si . N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nwere ọtụtụ ihe mgbochi na-egbochi ụmụ nwanyị ịbanye n’ụlọ ọrụ ndị a.” [3]
- “Ohere dị ukwuu di ugbu a . Usoro ọrụ na-agbanwe agbanwe di n'ukwu ugbu a. Ọ dị ezigbo mkpa ka ụmụ nwanyị na-alaghachi n’ọrụ nwee ike ịlaghachi n’ọkwa ha nọ mbụ, ma nweta nkwado site n’usoro enyemaka dịka nduzi na ndụmọdụ ọrụ .” [4]
- “Anyi kwesịrị ịhụ ndị isi nọ n’ọkwa dị elu ka ha ghara naanị ikwu okwu kwesịrị ekwesị. Ha ga-etinyerịrị ụkpụrụ ndị ahụ n’ọrụ kwa ụbọchị na omume nke òtù ha,Mgbanwe omenala pụrụ iwe ọtụtụ afọ, ma ọ dị oké mkpa".[5]
