Joseph Brackett

'Nke a bụ onyinye ịbịa ebe anyị kwesịrị ịnọ ,
Mgbe anyị chọtara onwe anyị n'ebe ahụ n'aka nri,
'Ọ ga adị na ndagwurugwu nke ịhụnanya na obi ụtọ.
Joseph Brackett, Jr. (amụrụ n'ụbọchi isii nke ọnwa Mee 1797 – ụbọchị anọ nke ọnwa Julaị 1882) bụ onye ode egwu na onye okenye nke Shaker na mba Amerika, amara ya dịka onye dere egwu a bụ "Onyinye dị mfe."
Okwu Okwuru
[dezie]
Ịkpọ isi ala na ihulata agaghị abụ anyị ihe ihere,
Ịtụgharị, Ntụgharị ga abụrụ anyị obi ụtọ
'Ruo mgbe anyị tụgharịrị , ntụgharị anyị ga-abịa gburugburu na ezie.
Onyinye dị Mfe (1848)
[dezie] 'Nke a bụ onyinye ịdị mfe, 'nke a bụ onyinye ntọhapụ ,
'Nke a bụ onyinye ịgbatute ebe anyị kwesịrị ịnọ ,
Ma mgbe anyị hụtara onwe anyị ebe ahụ dị mma ,
'Ọ ga abụ na ogige nke ịhụnanya na obi ụtọ .
Mgbe enwetere eziokwu dị mfe
Ihulata na ịkpọ isi ala agaghị abụ anyị ihere,
Ịtụgharị,ntụgharị ga abụrụ anyị obi ụtọ
'Sitena ịtụgharị, ntụgharị ga abịa n'ezie .
- Ka oge na-aga, a na-agbanwekarị ahịrịokwu ndị a ka ha bụrụ "'Nke a bụ onyinye", kama nke mbụ "'Nke a bụ onyinye ahụ".egwu a bụ ihe a na-amaghị nke ọma n'èzí obodo Shaker ruo mgbe Aaron Copland jiri egwu ahụ mee ihe n'egwu ya nke afọ 1944 bụ "Appalachian Spring".Ọtụtụ mmadụ echewo na egwu "Simple Gifts" bụ egwu ọdịnala nke ndị Celt (dịka e si kwuo ya, dịka e si eji ya eme ihe n'egwuregwu ihe nkiri Lord of the Dance)mana egwu a na egwu mbụ bụ n'ezie ihe ndị Joseph Brackett dere.Abụ mbụ nke egwu "Lord of the Dance", nke dabere na egwu ahụ, bụ onye na-ede egwu Quaker Sydney Carter dere na 1963, e mekwara ha (n'amaghị ebe ha si malite) n'enweghị ikike ma ọ bụ nkwenye n'egwuregwu ahụ, mana e mechara mee nkwupụta, ma hazie ụfọdụ ụgwọ eze. Emeela ọtụtụ mgbanwe na parodies ndị ọzọ kemgbe ahụ.
Alison Krauss performance · Performance by the King's Singers - GMCLA performance · Ndokwa nke John Williams mere maka emume ncheta ọchịchị onyeisiala mba Amerịka bụ Barack Obama
Okwu gbasara Brackett ma ọ bụ "Onyinye Dị Mfe"
[dezie]
- Nwoke dere nke a kwuru na ọ bụ site na mkpali dị nsọ ka o si bịa, ekwere m n'ezie na ọ gaara abụ eziokwu. Nke a nwere ike ịbụ egwu zuru oke . Abụla m ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 15,000 kemgbe ọtụtụ afọ, ike agwụghịkwa m.
- Randy Folger,onye bụrụ abụ ahụ kwa ụbọchị izu maka ndị ọbịa na "Shakers Village" dị na Pleasant Hill, Kentucky .
- Echere m na ọ bụghị onye a zụrụ azụ n'egwú, dịka m si mara site na nnyocha m. Enweghị ọtụtụ ihe ndabere ịchọta na ajụjụ a, mana ekwenyere m na ọ mụtara egwu dịka e si nye ya ya n'obodo.
Ha chere na ọ bụ onyinye obodo iji nwee ike ide egwu, onyinye sitere n'aka Chineke.Ha dere gbasara ahụmịhe ahụ dịka ha natara abụ n'ụzọ mkpali.
Roger Hall, na na Ndụ Dị Mfe: Chọpụta onyinye ime mmụọ nke Shakers.
- Nzukọ Mba Ndị Na-akụzi Egwu — òtù ọkachamara maka ndị nkuzi egwu Amerịka — kpọrọ ya aha n'ime abụ ole na ole onye ọ bụla bụ onye Amerika kwesịrị ịma.
Ndị nkuzi tinyere ya n'ọkwa kachasị elu ebe ahụ site na "Egwu Mba," "Egwu Agha nke Mba" na "Ụlọ n'Ọgbakọ."
- Mmadụ niile kwetara na nke a bụ abụ nke ndị Amerịka niile kwesịrị inwe ike ịbụ. Ọ bụ ihe a na-ahụkarị n'etiti ndị nkuzi. Mụ na ụmụaka nọ n'ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị kwurịtara okwu gbasara ya. Onye ọ bụla na-eto eto nwere ike ịgwa gị ihe egwu a pụtara: Idi mfe na-aka mma mgbe ụfọdụ karịa mgbagwoju anya, anyị ekwesịghịkwa iwere onwe anyị dị ka ihe dị oke mkpa.
- Will Schmid, Onyeisi nke Nzukọ Ndị Nkụzi Egwu nke 1996, dịka esi kwụpụta na "Sitena Lord of the Dance to Oldsmobile ads, egwu Shaker 'Simple Gifts'enwere ike ịnụ ugbu a n'ebe dị iche iche " na Knight Ridder/Tribune News Service (30 November 1998)
Njikọ Mpụga
[dezie]- Sabbathday Lake Shaker Village
- Simple Gifts at The Boston Camerata
- Joseph Brackett's Simple Gifts