Gaa na ọdịnaya

Imaobong Nse Uko

Sitere na Wikiquote

Imaobong Nse Uko (amụrụ 20 Febrụwarị 2004) bụ onye egwuregwu Naịjirịa.

Okwu okwuru

[dezie]
  • Enwere m obi ụtọ maka mmemme ahụ niile ka ndị ezinụlọ m na ndị enyi m nwekwara obi ụtọ. Ana m ekele Chukwu na Oriakụ Ulaeto, onye nkuzi m bekee bụ onye chọpụtara m. Ọ bụ ya nyefere m ka m bụrụ onye nchịkwa Effiong Ibok bụ onye n'onwe ya hapụrụ m n'okpuru ọzụzụ ọkachamara nke onye nchịkwa Daniel Umoette. Enwere m ekele maka Oriakụ Janet Bassey, onye ode akwụkwọ egwu na ubi na Akwa Ibom State Ministry of Youths and Sports. Ana m ekelekwa ndị otu m niile yana ndị niile gbara m ume.
  • O siri ike nke ukwuu n'ihi ihu igwe. Nke a bụ naanị mmalite nke nnukwu ihe na ọrụ m. Mụ na onye nchịkwa m rụsiri ọrụ ike na nke a. Obi bụ m sọ anụrị; ọ ga-aka mma. Ịbịa ebe a ka m nwee mmetụta dị ukwuu na-eme m obi ụtọ. Ọ pụtara ịrụsi ọrụ ike karị, mana ọdịnihu na-egbuke egbuke.
  • Obi dị m ụtọ na ihe na-aga nke ọma, ana m Chineke maka ọganihu e mere ugbu a. Esi m na mpaghara osimiri dị na ime obodo Ibeno bụ ebe m na-enyere ndị mụrụ m aka ka ha gbute crayfish. Ana m ekelekwa nne na nna m na ndị nkuzi m bụ ndị na-edobe m n'ụkwụ m. M na-atụ anya ka m nweta ọrụ na-aga nke ọma na egwuregwu.

Njiko Mpuga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: