Gladys West
Ọdịdị
Gladys West (née Brown; amuru October 27, 1930) bu onye Mgbakọ na mwepụ mba America. A maara ya maka ntinye aka ya na nhazi mgbakọ na mwepụ nke ọdịdị ụwa, na ọrụ ya na mmepe nke ụdị satịlaịtị geodesy, nke e mesịrị tinye na Global Positioning System (GPS).
okwu ndị okwuru
[dezie]- Ọ nwere akụkọ ihe mere eme iji chọpụta, ebe ịzụ ahịa, nri dị mma na ikuku dị jụụ.
- A chọsiri ike ime ihe na-abụghị ọrụ ugbo, amakwa m na inwe ezigbo agụmakwụkwọ ga-abụ isi ihe.
- Nke ahụ kpaliri m ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ka m nwee ike inweta ohere ịgụ akwụkwọ na ịga mahadum. Enwere m usoro nkwado dị ukwuu na ọtụtụ ndị ndụmọdụ n'ụzọ bụ ndị na-akpali m.
- Ọ na-enye ume ọhụrụ mgbe niile ịnụ ka e si eji ọrụ m ugbu a na mpụga gọọmentị ma ọ ka na-eju m anya maka ọganihu teknụzụ emeela kemgbe ọrụ GPS malitere na afọ 1973.
- Ọ dịghị mgbe ọ ga-aka nká. Obi dị m ụtọ na m nwere ike inye onyinye. Mgbe m na-arụ ọrụ, ọ dịghị mgbe m chere na a ga-eji GPS mee ihe n'ụwa ndị nkịtị. Ọ na-amasị m ịhụ ụzọ niile enwere ike iji ya ma eleghị anya amaghị m etu esi eji ya eme ihe.
