Gaa na ọdịnaya

Folawe Omikunle

Sitere na Wikiquote

Folawe Omikunle gụrụ akwụkwọ na Mahadum Babcock ma nweta nzere bachelọ na iwu mba ụwa na igbaso ụkpụrụ (Bachelor of Law and Diplomacy) n'afọ 2008. Mgbe o nwetachara nzere Mastas ya (Masters Degree) site na Diplomatic Academy of London, Mahadum Westminster n'afọ 2010, ọ laghachitara Naijiria wee were ọkwa dị ka onye isi nchịkwa ụlọ akwụkwọ na Kradle Academy, Montessori Pre-school dị na Legọs Naijiria. N'afọ 2015, Folawe sonyeere ụlọ ọrụ Teach For Nigeria dịka onye Nlekọta Mmemme na mmalite ya. Ọ gbanwere ngwa ngwa ịghọ nnukwute onye isi ụlọ ọrụ ahụ n'afọ 2016, na-eduzi mmalite, atụmatụ, na òtútó nke ụlọ ọrụ ahụ; ịzụlite mmekọrịta nye ndị isi ihe metụtara; ichụ nta ego; nakwa ịnọ n'isi ụgbọ nke mmepe ụlọ ọrụ ahụ. N'afọ 2017, a kpọrọ Folawe dịka ótù n'ime ndị Naijiria na-eto eto dị ótù narị n'ọnụ ọgụ ndị ùdé ha kachasị èdé na Naijiria, bụ nkwanye ùgwù nke na-ahụta ahụmahụ ya na ntinye aka ya na mmepe mmekọrịta mmadụ na ibe ya. O nyefeela ndụ ịrụ ọrụ ya niile dịka onye ọkachamara n'ịlụso ihe ịma aka mgba niile dị na ngalaba agụmakwụkwọ na Naịjirịa ọgụ.

Ihe Ndi O Kwuru

[dezie]
  • Ọ bụrụ na anyị ga-edozi ụfọdụ nsogbu ọrụ anyị kacha njọ, ọ ga-abanye wee hụ na onye ọbụla na-ahapụ obere obodo na ọ bụ n'efu na ebe ahụ anyị enweghị ike iwepụ ọ̀kàrà ọnụ ọgụ ndị bi n'ụwa anyị bụ ụmụ nwanyị n'ihi na ikpochapụ ha n'ọkwá ọchịchị na-amalite site na naanị ozi wee malite n'ịkụzi ihe.
  • Nkà na ụzụ pụrụ inye aka weta òtútó n'ụzọ a na-agaghị akọwanwu, mana ọ bụghị ma ọlị ihe ngwọta n'onwe ya iji dozie nsogbu nile nke kọntinent ahụ.
    • [1] Folawe Omikunle n'okwu o kwuru n'ụzọ a ga-esi agbanwe akaraaka kọntịnentị anyi

Njikọ Mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: