Folawe Omikunle
Folawe Omikunle gụrụ akwụkwọ na Mahadum Babcock ma nweta nzere bachelọ na iwu mba ụwa na igbaso ụkpụrụ (Bachelor of Law and Diplomacy) n'afọ 2008. Mgbe o nwetachara nzere Mastas ya (Masters Degree) site na Diplomatic Academy of London, Mahadum Westminster n'afọ 2010, ọ laghachitara Naijiria wee were ọkwa dị ka onye isi nchịkwa ụlọ akwụkwọ na Kradle Academy, Montessori Pre-school dị na Legọs Naijiria. N'afọ 2015, Folawe sonyeere ụlọ ọrụ Teach For Nigeria dịka onye Nlekọta Mmemme na mmalite ya. Ọ gbanwere ngwa ngwa ịghọ nnukwute onye isi ụlọ ọrụ ahụ n'afọ 2016, na-eduzi mmalite, atụmatụ, na òtútó nke ụlọ ọrụ ahụ; ịzụlite mmekọrịta nye ndị isi ihe metụtara; ichụ nta ego; nakwa ịnọ n'isi ụgbọ nke mmepe ụlọ ọrụ ahụ. N'afọ 2017, a kpọrọ Folawe dịka ótù n'ime ndị Naijiria na-eto eto dị ótù narị n'ọnụ ọgụ ndị ùdé ha kachasị èdé na Naijiria, bụ nkwanye ùgwù nke na-ahụta ahụmahụ ya na ntinye aka ya na mmepe mmekọrịta mmadụ na ibe ya. O nyefeela ndụ ịrụ ọrụ ya niile dịka onye ọkachamara n'ịlụso ihe ịma aka mgba niile dị na ngalaba agụmakwụkwọ na Naịjirịa ọgụ.
Ihe Ndi O Kwuru
[dezie]- Ọ bụrụ na anyị ga-edozi ụfọdụ nsogbu ọrụ anyị kacha njọ, ọ ga-abanye wee hụ na onye ọbụla na-ahapụ obere obodo na ọ bụ n'efu na ebe ahụ anyị enweghị ike iwepụ ọ̀kàrà ọnụ ọgụ ndị bi n'ụwa anyị bụ ụmụ nwanyị n'ihi na ikpochapụ ha n'ọkwá ọchịchị na-amalite site na naanị ozi wee malite n'ịkụzi ihe.
- Nkà na ụzụ pụrụ inye aka weta òtútó n'ụzọ a na-agaghị akọwanwu, mana ọ bụghị ma ọlị ihe ngwọta n'onwe ya iji dozie nsogbu nile nke kọntinent ahụ.
- [1] Folawe Omikunle n'okwu o kwuru n'ụzọ a ga-esi agbanwe akaraaka kọntịnentị anyi
Njikọ Mpụga
[dezie]- Folawe Omikunle na Wikikwuotu bekee
- Folawe Omikunle na Wikipidia Igbo
