Fatuma Abdi Jehow
Ọdịdị
Fatuma Abdi Jehow bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Kenya si Wajir county. Onye otu National Assembly of Kenya. Onye nnọchi anya ụmụ nwanyị ugbu a maka mpaghara Wajir. O meriri oche site na Orange Democratic Movement na ntuli aka izugbe Kenya nke 2022. Ọnwa isii agaala kemgbe Jehow nwetara oche nnọchiteanya ụmụ nwanyị. Jehow meriri oche ahụ site na vootu 36,064 megide ndị mmadụ iri na otu na-azọ ọkwa otu oche. Otu n'ime ndị o meriri bụ onye nnọchi anya ụmụnwaanyị nọ na mpaghara Wajir n'oge ahụ bụ Fatuma Gedi, onye jisiri ike nweta vootu 22,956.
Okwu okwuru
[dezie]- Ndị anyị enwetala ọnọdụ ụkọ mmiri ozuzo dị egwu n'ihi ọdịda nke oge mmiri ozuzo isii na-esochi. Nke a bụ isi ihe na-egosi ọnọdụ anyị ugbu a, nke anyị kwesịrị ịta ụta n'ụzọ ụfọdụ maka enweghị nkwado na iwusi iwu ndị dị adị karịsịa na mmiri, anụ ụlọ na ọrụ ugbo.
