Fatima Massaquoi
Ọdịdị
Fatima Massaquoi-Fahnbulleh (25 Disemba 1911 – 26 Nọvemba 1978) bụ onye odee na onye gụrụ akwụkwọ nke ukwuu si mba Liberia. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na mba Amerika, ọ laghachiri Liberia n'afọ 1946, ebe O emere akara ngosi pụtara ìhè na ndụ omenala na mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke mba ahụ.
Ihe Ndi O Kwuru
[dezie]- Obodo ukwu a nwere ihe niile bụ ihe ọma na ihe ọjọọ. O nwere ndị ikom na ndị inyom nwere ọmịiko, bụ ndị pụrụ ịdị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị òtù ha pụrụ inwe obiọma nye ndị ọzọ. Enwere, n'okwu nke Goethe, ọtụtụ ìhè, ma enwekwara nnukwu ndò.
- [1] Fatima mgbe Ọ na-akọ maka ahụmihe ya niile na mba Amerika.
- Mana n'agbanyeghị ihe ndị a niile, nnwere onwe ebe a enweghị atụ; ya mere na ọbụghị ihe ijuanya na enwere ike igbu onye Negro, ma onye Negro ọzọ eguzoro na-abụ abụ sị, obodo m, ọ́ bụ maka gi.
- [2] Fatima n'okwu ya maka nnwere onwe na mba Amerika.
- Enwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta n'aka mba Amerika, ma ọ bụrụ na anyị nwere ike kpụchaa ihe otite varnish ahụ etere n'elu wee were osisi ndị siri ike na-ereghị ere dị n'okpuru.
- [3] Fatima n'okwu ya maka mba Amerika.
Njikọ Mpụga
[dezie]- Massaquoi Fatima na Wikikwuotu bekee
- Massaquoi Fatima na Wikipidia Igbo
