Everlyn Chemutai
Ọdịdị
Everlyn Chemutai
Everlyn Chemutai (amụrụ 12 Ọktoba 1976) bụ onye ngụkọ ego na onye omebe iwu Uganda. Ọ bụla nwanyị onye nnọchi anya nzuko omeiwu nke Uganda maka Bukwo District kamgbe 2016. E jikọtara ya na National Resistance Movement (NRM).
Okwu ndị okwuru
[dezie]- Anyị enweghị ike ịnọ nkịtị ka a na-egbu ndị anyị.
- N'agbanyeghị na e nwere nkwekọrịta mbụ n'etiti obodo na UWA iji dozie esemokwu ndị a, ọnọdụ ahụ ka na-akawanye njọ.
- Dị ka a na-ekwu, "Ahụike bụ akụ." Ọ bụrụ na anyị ebuteghị ya ụzọ, anyị ga-aga n'ihu na-efunahụ ọ bụghị naanị ndụ kamakwa ndị na-eme egwuregwu na-eje ozi dị ka ndị nnọchianya mpako nke Uganda na ọkwa ụwa.
- Anyị agakwuru ndị ozi gbasara ịkwalite ụlọ ọrụ ahụike wee nweta nzaghachi dị mma, n'agbanyeghị na ọganihu adịla ngwa ngwa.
- Mgbe anyị na-ekwurịta make ụmụ nwanyị ime obodo, anyị ka na-eche ihe ịma aka nke FGM ihu, karịsịa n'ime Kalenjin na ụfọdụ obodo Sabiny, ebe omume ahụ na-aga n'ihu na nzuzo, na-emerụ ụmụ agbọghọ.
